Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 27:22 - Bible Nso

22 Ndi-ahia nke Sheba na Reama, ndi ahu bu ndi-ahia-gi: ha jiri uda kachasi uda nile nma, ji kwa nkume nile nke di oké ọnu-ahia, na ọla-edo, zua ihe-ahia-gi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “ ‘Ndị ahịa Sheba, na Raama, bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ụda dị iche iche na nkume dị oke ọnụahịa, na ọlaedo akwụ gị ụgwọ ihe ha zụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 27:22
11 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.


Israel, bú nna-ha, we si ha, Ọ buru na ọ di otú a ub͕u a, menu nka; werenu ufọdu nime ihe makarisiri mma nke ala nka n'ihe-unu, wedakwara nwoke ahu onyinye-inata-iru-ọma, nwantī balm, na nwantī manu-aṅu, na uda di iche iche, na myrrh, na ákú, na almond:


Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka. Umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.


Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri buruburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: Ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso.


Ya di kwa ndu! agēnye kwa ya ufọdu n'ọla-edo Sheba: Agēkpe kwa ekpere bayere ya mb͕e nile; Ogologo ubọchi nile ka agāgọzi ya.


Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto Jehova ka ha gēzisa.


Olu ìgwè madu ndi nọ n'udo di kwa nime ya: tukwasi kwa ndikom ndi sitere n'ọra madu, emewo ka ndi nāṅubiga manya ókè si n'ọzara bia; ha we tiye ọla-aka n'aka nke ndinyom ahu, na okpu-eze mara nma n'isi-ha.


N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.


Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan