Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 27:15 - Bible Nso

15 Umu Dedan bu ndi-ahia-gi: ọtutu agwe-etiti bu ahia aka-gi: ezé enyi na osisi ebony ka ha butere dika ùtú-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “ ‘Ndị ahịa si na Dedan bụkwa ndị ahịa gị. Otu a kwa ọtụtụ ndị bi nʼọnụ mmiri bụkwa ndị ahịa gị. Ha ji ọdụ, na osisi eboni kwụọ gị ụgwọ ihe ha zụrụ gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 27:15
13 Iomraidhean Croise  

Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.


Jọkshan muru Sheba, na Dedan. Umu Dedan we buru Ashurim, na Letushim, na Leumim.


N'ihi na eze nwere ub͕ọ Tashish n'oké osimiri tiyere ub͕ọ Hairam: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.


Umu-ndikom Ketura kwa, bú nwayi-iko Abraham: ọ muru Zimran, na Jọkshan, na Medan, na Midian, na Ishbak, na Shua. Umu-ndikom Jọkshan kwa; Sheba, na Dedan.


Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka. Umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.


N'ihi na eze nwere ub͕ọ-nke nējeru Tashish nēso ndi-orù Huram: otù ub͕ò n'arọ atọ ka ub͕ọ Tashish nābia, nēbute ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọdu, na enwe, na ekwuru-ulo.


Ibu ebero Arebia. N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.


Dedan, na Tima, na Buz, na ndi nile akọpuworo usọ isi-ha;


B͕alaganu, chigharia, biri n'ebe di omimi, unu ndi bi na Dedan; n'ihi na nhuju-anya Isọ ka M'gēme ka ọ biakwasi ya, mb͕e M'gēleta ya.


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a, M'gēseti kwa akam n'aru Edom, bipu nime ya madu na anumanu, me ya nkpọnkpọ ebe site na Timan; ọbuná rue Dedan ka ha gāda na mma-agha.


Dedan bu onye-ahia-gi n'ákwà sara mbara iji nọkwasi inyinya.


Sheba na Dedan na ndi-ahia Tashish na umu-ọdum-ya nile gāsi gi, Ọ̀ bu ikwata ihe-nkwata ka gi onwe-gi nābia? ọ̀ bu iluta ihe-nluta n'agha ka i kpọkọtaworo nkpọkọta ndi-gi? ọ̀ bu ibupu ọla-ọcha na ọla-edo, ichipu anu-ulo na ihe-ahia, ikwata oké ihe-nkwata?


ihe-ahia ọla-edo, na ọla-ọcha, na nkume di oké ọnu-ahia, na pearl, na ezi ákwà ọcha, na ákwà ododo, na nkisi, na ákwà uhie; na osisi nile ọ bula nēsì ísì utọ, na ihe nile ọ bula eji ọdu me, na ihe nile ọ bula eji osisi dikarisiri oké ọnu-ahia, ma-ọbu ọla, ma-ọbu ígwè, ma-ọbu marble, me;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan