Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:5 - Bible Nso

5 Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ ga-aghọkwa ebe ndị ọkụ azụ na-agbasa ụgbụ ha nʼetiti oke osimiri. Nʼihi na mụ onwe m ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. Ọ ga-aghọkwara mba niile dị iche iche ihe a kwatara nʼagha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:5
6 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, Mu onwem esetiwo akam n'aru gi, M'gēwere kwa gi nye ka i ghọrọ mba nile ihe-nluta-n'agha; M'gēbipu kwa gi n'aru ndi nile di iche iche, me ka i si n'ala nile la n'iyì: M'gēkpochapu gi: i we mara na Mu onwem bu Jehova.


M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;


Ha gēbuliri gi abù-ákwá n'igo-ákwá-ha, bùara gi abù-ákwá, si, Ònye di ka Taia, ònye di ka obodo ahu nke emere ka o dere du n'etiti oké osimiri?


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, M'gaje inye Nebukadreza, bú eze Babilon, ala Ijipt; ọ gāchilaga kwa ìgwè ndi-ya, kwata ihe-nkwata-ya, luta ihe-nluta-ya n'agha; o we buru ugwọ-ọlu agākwu usu-ndi-agha-ya.


Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan