Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:2 - Bible Nso

2 Nwa nke madu, n'ihi na Taia ekwuwo okwu megide Jerusalem, si, Ehe, etipiawo ya, bú obodo nke bu ọnu-uzọ ndi nile di iche iche; o chighariwo n'ebe m'nọ: m'gēju eju, emewo ya nkpọnkpọ ebe:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Nwa nke mmadụ, Taịa aṅụrịala ọṅụ nʼihi ọdịda Jerusalem. Ọ na-ekwukwa na-asị, ‘Ahaa, agbajiela obodo ahụ bụ ọnụ ụzọ e si eje mba dị iche iche. Ọnụ ụzọ ama ya niile egherekwala oghe nye m. Ugbu a, e mebirila ya, ihe ga-agara m nke ọma karịa.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:2
27 Iomraidhean Croise  

Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n'osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo.


Ha we me ka ọnu-ha sa mbara imegidem; Ha siri, Ehe, ehe, anya-ayi ahuwo ya.


Ka ha tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsim, Ehe, ehe.


Ka obi tọ ndi nile nke nāchọ Gi utọ, ka ha ṅuri kwa ọṅu nime Gi: Ka ndi nāhu nzọputa-Gi n'anya nāsi mb͕e nile, Ka Jehova di uku.


Ka ha laghachi azu n'ihi ihere-ha, Bú ndi nāsi, Ehe, ehe!


Gebal, na Amon, na Amalek; Filistia, ya na ndi bi na Taia:


Gabiganu, gabiganu n'ọnu-uzọ-ama nile; dozienu uzọ ndim; tulienu, tulienu uzọ atuliri atuli; tutupunu nkume; bulienu ọkọlọtọ n'elu ndi nile di iche iche.


na eze nile nke Taia, na eze nile nke Zaidon, na ndi-eze nke agwe-etiti nke di n'ofè oké osimiri;


chiri ha zigara eze Edom, ziga-kwa-ra eze Moab, ziga-kwa-ra eze umu Amon, ziga-kwa-ra eze Taia, ziga-kwa-ra eze Zaidon, site n'aka ndi-ozi ndi nābiaru Jerusalem nābiakute Zedekaia, bú eze Juda;


n'ihi ubọchi ahu nke nābia ipunara ndi Filistia nile ihe-ha, ibipu na Taia na ibipu na Zaidon onye-iye-aka ọ bula nke fọduru: n'ihi na Jehova nāpunara ndi Filistia ihe, bú ndi agwe-etiti Kaftoa fọduru.


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


nye umu Iru-anyanwu, tiyere umu Amon, M'gēwere kwa ya nye ka ọ buru ihe ha nwetara, ka ewe ghara icheta umu Amon n'etiti mba nile:


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i kuwo aka, zọ ukwu n'ala, ṅuria ọṅu na nleli-gi nile nime nkpuru-obi-gi megide ala Israel;


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na Moab na Sia nāsi, Le, ulo Juda di ka mba nile;


O rue, n'arọ nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa, na okwu Jehova rurum nti, si,


N'ihi na i siwo, Mba abua ndia na ala abua ndia gābu nkem, ayi gēnweta kwa ya; ma Jehova nọrọ n'ebe ahu:


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:


Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.


ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan