Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:19 - Bible Nso

19 N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Mgbe m mere ka ị ghọọ obodo tọgbọrọ nʼefu, dịka obodo niile nke mmadụ na-ebighị, mgbe m mekwara ka ogbu mmiri nke oke osimiri bịakwasị gị, mgbe ọtụtụ mmiri ya kpuchiri gị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:19
7 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, Taia, M'gēme kwa ka ọtutu mba rigota imegide gi, dika oké osimiri si eme ka nmali-miri-ya nile rigota.


Ọ bu ọtutu miri ka ndi nānyà gi meworo gi ka i ba: ifufe Iru-anyanwu etiwawo gi n'etiti oké osimiri nile.


O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara.


Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan