Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:14 - Bible Nso

14 M'gēme kwa ka i ghọ nkume di elu nke ihe nādighi ya: ebe ib͕asa ub͕u ka i gābu; agaghi-ewu kwa gi ọzọ: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Aga m emekwa ka ala gị ghọọ ala nkume nkume, nke ihe na-adịghị nʼime ya. Ị ga-abụkwa ebe ndị ọkụ azụ ga na-agbasa ụgbụ ha. Ọ dịghị onye ga-ewuzi gị ọzọ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:14
18 Iomraidhean Croise  

Le, Ọ nākwada ihe, agaghi-ewu kwa ya ọzọ; Ọ nēmechibido madu uzọ, agaghi-emeghe kwa ya.


Ì nēmebi kwa ikpém? I nāmam ikpe, ka i we buru onye ezi omume?


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo; ònye gēmebi kwa ya? aka-Ya esetiwo kwa; ònye gēme kwa ka ọ laghachi azu.


O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.


I gāghọrọ ọku nri; ọbara-gi gādi n'etiti ala-gi; agaghi-echeta gi: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.


Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.


M'gēme kwa ka osimiri Nail nile ghọ ebe kpọrọ nku, M'gēre kwa ala ahu n'aka ndi ọjọ, me ka ala ahu na ùjú-ya tọb͕ọrọ n'efu, site n'aka ndi ala ọzọ: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu.


Ọ gēru kwa, na ndi-ọkù gēguzo n'akuku ya: site n'En-gedi we rue En-eglaim gābu ebe ib͕asa ub͕u; iche iche ka azù-ha gādi, dika azù oké osimiri uku, bara uba nke-uku.


Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.


Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:


M'gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n'etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Chineke abughi madu, nke O gēkwu okwu-ugha; Ọ bughi kwa nwa madu, nke Ọ gēlogha: Ọ̀ bu na Ya onwe-ya asiwo na Ọ gēme ihe, ma O meghi ya? Ma-ọbu Ò kwuwo okwu, ma O meghi ya ka o guzosie ike?


Elu-igwe na uwa gāgabiga, ma okwu nile nkem agaghi-agabiga ma-ọli.


I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan