Izikiel 26:13 - Bible Nso13 M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ. Faic an caibideil |
N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.