Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:13 - Bible Nso

13 M'gēme kwa ka ùzù nke abù-gi nile kwusi; agaghi-anu kwa olu nke ubọ-akwara-gi nile ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Aga m emekwa ka ụzụ nke abụ gị niile kwụsị. A gaghị anụkwa ụda ụbọ akwara gị ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:13
16 Iomraidhean Croise  

N'osisi willow di n'etiti ya Ka ayi nēkokwasi ubọ-akwara nile ayi.


Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.


Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha.


O we si, I gaghi-aṅuri kwa Ọṅu-agha ọzọ, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke anēmeb͕u, bú ada Zaidon: bilie, gabiga rue Kitim; ọbuná n'ebe ahu ọ dighi izu-ike i gēnwe.


Were ubọ-akwara, jegharia n'obodo buruburu, gi nwanyi nākwa iko nke echezọrọ echezọ; kpọ ya nke-ọma, bùa ọtutu abù, ka ewe cheta gi.


Ọ̀ bu nka ka anēme unu, gi obodo nāṅuri ọṅu, nke mb͕e gara aga ya sitere n'ubọchi nile nke mb͕e ochie, onye ukwu-ya abua nēdu ya-ri je n'ebe di anya inọ dika ọbìa?


Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ọzọ, M'gēme ka olu obi-utọ, na olu ọṅù, na nwoke nālu nwunye ọhu, na olu nwanyi anālu ọhu, na olu nkume-igwe-nri, na ìhè oriọna, lanari ha n'iyì.


M'gēme kwa ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nke nwoke nālu nwunye ọhu na olu nke nwanyi anālu ọhu kwusi n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: n'ihi na nkpọnkpọ ebe ka ala nka gāghọ.


N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.


M'gēme kwa ka obi-utọ ya nile kwusi, ya na ememe-ya, na ọnwa ọhu ya, na ubọchi-izu-ike-ya, na mb͕e-ya nile akara àkà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan