Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 26:12 - Bible Nso

12 Ha gākwata àkù-gi, luta ihe-izu-ahia-gi n'agha, kwatu mb͕idi-gi nile, ọ bu kwa ulo nile nke i nāchọsi ike ka ha gākwada: ọzọ, nkume-gi nile na osisi-gi nile awara awa na ájá-gi ka ha gātọb͕ọ n'etiti miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ha ga-akwara akụ gị niile, na ihe ahịa gị niile dịka ihe ha dọtara nʼagha. Ha ga-akwatu mgbidi gị niile, na ụlọ ọma gị niile, kpokọtaa osisi gị niile, na nkume niile, na ngwongwo niile nʼabaghị uru wụnye ha nʼime osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 26:12
19 Iomraidhean Croise  

Hezekaia we nwe àkù na nsọpuru riri nne nke-uku: o we mere onwe-ya ulo-àkù idebe ọla-ọcha, na idebe ọla-edo, na idebe nkume di oké ọnu-ahia, na idebe uda di iche iche, na idebe ọta, na idebe ihe nile anāchọsi ike;


Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.


Aka-Ya ka O setiworo n'elu oké osimiri, O mewo ka ala-eze di iche iche ma jijiji: Jehova enyewo iwu bayere Kenean, ikpochapu ebe siri ike ya nile.


Ònye zubeworo nka megide Taia, bú obodo nke nēkpube ndi ọzọ okpu-eze, nke ndi-ahia-ya bu ndi-isi, nke ndi-ọzu-ahia-ya bu ndi-nsọpuru nke uwa?


N'ihi ara nile ka ha ganēti aka n'obi, n'ihi ubi nile anāchọsi ike, n'ihi osisi vine nāmi nkpuru,


Kwasienu ákwá ike, unu ndi-ọzùzù-aturu, ti-kwa-nu nkpu; turu-kwa-nu na ntu, unu ndi di ebube n'etiti ìgwè ewu na aturu: n'ihi na ubọchi-unu eruzuwo ka eb͕ue unu, M'gākpasa kwa unu, unu gāda kwa dika ihe anāchọsi ike.


Usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea, ndi soro onye-isi ndi-ob͕ū, kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem buruburu.


Ebe ib͕asa ub͕u ka ọ gābu n'etiti oké osimiri; n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ọ gāghọ-kwa-ra mba nile ihe-nluta-n'agha.


Rue olùlù ka ha gēme ka i rida; i gānwu kwa ọnwu nke ndi eb͕uru eb͕u, n'etiti oké osimiri nile.


ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.


Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.


N'ihi nka, ebe unu nāzọb͕u onye nēnweghi ike, ebe unu nānara kwa ya ọka wheat n'ùtú: ulo nkume awara awa ka unu wuworo, ma unu agaghi-ebi nime ha; ubi-vine anāchọsi ike ka unu meworo, ma unu agaghi-aṅu manya-vine-ha.


Lutanu ọla-ọcha n'agha lutanu ọla-edo n'agha: ọ dighi kwa ọgwugwu diri àkù edoziri edozi, bú ebube nke sitere n'ihe nile anāchọsi ike.


ma M'gēfesa ha dika oké ifufe n'etiti mba nile ndi ha nāmaghi. Ala nka we tọb͕ọrọ n'efu n'azu ha, ghara inwe onye-ngabiga ma-ọbu onye nālata: n'ihi na ha mere ala anāchọsi ike ka ọ ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan