Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 24:23 - Bible Nso

23 Ihe-ike-n'isi-unu gādi kwa unu n'isi, akpukpọ-ukwu-unu gādi kwa n'ukwu-unu: unu agaghi-eti aka n'obi, unu agaghi-akwa kwa ákwá; ma unu gāta aru n'ajọ omume nile unu, surita onwe-unu ude.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ihe ikechi isi unu ga-adịgide nʼisi unu, akpụkpọụkwụ unu ga-adịkwa nʼụkwụ unu. Unu agaghị akwa akwa maọbụ tie aka nʼobi, kama unu ga-ata ahụ nʼihi mmehie unu, sụkwaa ude nʼetiti onwe unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 24:23
14 Iomraidhean Croise  

Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu, Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.


Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha.


Ndi-nchu-àjà-ha dara site na mma-agha; Ndinyom-ha di ha nwuru adighi-akwa kwa ákwá.


na mb͕e ahu Jehova kwuru okwu site n'aka Aisaia nwa Emoz, si, Je, tọpu ákwà-nkpe n'úkwù-gi, yipu kwa akpukpọ-ukwu-gi n'ukwu-gi. O we me otú a, b͕ara ọtọ nējeghari n'ukwu efu.


Ayi nāb͕ọ uja dika bear, ayi nile, ọ bu kwa dika nduru ka ayi nēkwosi ákwá ike: ayi nēle anya ikpé ziri ezi, ma ọ digh: ayi nēle anya nzọputa, ma ọ di anya n'ebe ayi nọ.


Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Ndi mma-agha b͕uworo adiwo nma kari ndi agu gub͕uworo; N'ihi na ndia nērùpu dika miri, buru ndi adupuworo adupú, ghara inwe ihe-omume nke ubi.


Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?


ka nri na miri we kọ ha, ka o we ju kwa ha anya, otù onye n'aru ibe-ya, ha ewe ta aru n'ajọ omume-ha.


Ihe-ike-n'isi nke flax gādi n'isi-ha, uwe-ukwu nke flax gādi kwa n'úkwù-ha, ha agaghi-eji ihe nākpata ọsusọ ke onwe-ha n'úkwù.


Mu onwem gēme kwa unu nka; M'gēme obi-ọlulọ-miri ka ọ buru onye-nlekọta-unu, bú ọtita-aru na aru-ọku, nēme ka anya-unu hubìe uzọ, nēme kwa ka nkpuru-obi-unu b͕azepu: unu gāgha kwa nkpuru-unu n'efu, ndi-iro-unu gēri kwa ya.


Ndi nāfọdu n'etiti unu gāta aru n'ajọ omume-ha n'ala nile nke ndi-iro-unu; ọzọ kwa, n'ajọ omume nile nke ndi bu nna-ha, ha gēso kwa ha ta aru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan