Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 24:21 - Bible Nso

21 Si ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ime ka ebe nsọm ghara idi nsọ, bú ihe-npako nke ike-unu, na ihe anya-unu abua nāchọsi ike, na ihe nke nkpuru-obi-unu nwere ọmiko n'aru ya; umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom, ndi unu rapuworo, gāda kwa site na mma-agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Gwa ụlọ Izrel, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu: Ana m aga ime ka ebe nsọ m ghara ị dị nsọ, bụ ebe e wusiri ike nke unu ji na-anya isi, ihe na-amasị anya unu, nke ihe banyere ya na-atọ obi unu ụtọ. Ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom, ndị unu hapụrụ ga-ada site na mma agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 24:21
33 Iomraidhean Croise  

M'gēbipu kwa Israel n'elu ala nka nke M'nyeworo ha; M'gēsi kwa n'irum tupu ulo a, nke M'doworo nsọ nye aham; Israel gāghọ kwa ilu na ihe-àkùkù n'etiti ndi ọzọ nile:


Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.


Bilie, Jehova, ba n'ebe-izu-ike-Gi; Gi onwe-gi, na ib͕e nke ike-Gi.


Otù ihe ka m'riọworo n'aka Jehova, nke ahu ka m'nāchọ; Ọ bu ka m'biri n'ulo Jehova ubọchi nile nke ndum, Ihu idi-utọ Jehova, na ijuta ihe n'ulo uku Ya.


Ha esuwo ebe nsọ Gi ọku; Ọbuná rue ala ka ha meworo ebe-obibi aha-Gi ka ọ ghara idi nsọ.


Chineke, mba di iche iche abatawo n'ihe-nketa-Gi; Ha emeruwo ulo uku Gi di nsọ; Ha emewo Jerusalem ka ọ ghọ ihe etikpọro etikpọ.


Le ka ebe-obibi-Gi nile si buru eba ahuru n'anya nke-uku, Jehova nke usu nile nke ndi-agha!


Ọbuná nnunu di ntà achọtawo ulo, Eléké achọtawo-kwa-ra onwe-ya akwu, ebe o tiyeworo umu-ya Bú ebe-ichu-àjà-Gi nile, Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ezem na Chinekem.


Ebube na ima-nma di n'iru Ya: Ike na nma di n'ebe nsọ Ya.


Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;


Ma ọnuma Jehova juputara nimem; ike gwurum inagide ya: wukwasi ya n'aru umu-ntakiri n'èzí, na n'aru ìzù umu-okorọbia n'otù: n'ihi na agēwere kwa ma di ma nwunye, ma okenye ma onye juputara n'ubọchi ndu-ya.


M'gēme kwa ulo a, nke akpọkwasiri aham, nke unu onwe-unu nātukwasi obi, M'gēme kwa ọnọdu a nke M'nyere unu, nye kwa nna-unu-hà, M'gēme ha dika M'gēme ha dika M'mere Shailo.


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Onye-nkpab͕u ab͕asawo aka-ya n'elu ihe-utọ nile nke Jerusalem: N'ihi na ọ huwo na mba di iche iche abatawo n'ebe nsọ ya, Bú ndi I nyere iwu bayere ha na ha agaghi-abà nime nkpọkọta I nwere.


Le, ka Onye-nwe-ayi si were igwe-oji kpuchie ada Zaion n'iwe-Ya! O siwo n'elu-igwe tuda ima-nma nke Israel n'ala, Ọ chetaghi kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya n'ubọchi iwe-Ya.


Nwa-okoro na agadi-nwoke edinawo ala n'èzí nile; Umu-ab͕ọghọm nāmaghi nwoke na umu-okorọbiam adawo site na mma-agha: I b͕uwo ha n'ubọchi iwe-Gi; I b͕usiwo, I nweghi ọmiko.


M'gēdo kwa ekworom imegide gi, ha gēmeso kwa gi n'ọnuma; imi-gi na nti-gi abua ka ha gēwezuga; ọzọ, ndi gēsota gi n'azu gāda site na mma-agha: umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom ka ha gāchiri; ọku gēripia kwa ndi gēsota gi n'azu.


Nkpọkọta madu ahu gēwere kwa nkume tub͕ue ha, were mma-agha-ha b͕ue ha; umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom ka ha gēb͕u, ulo nile ha ka ha gēsure n'ọku.


Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.


M'we si ha, Okwu Jehova rurum nti, si,


Ma unu gēme dika m'meworo: unu agaghi-ekpuchi eb͕ub͕ere-ọnu-elu-unu, unu agaghi-eri kwa nri nke ndi ọzọ.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, ọ̀ gaghi-adi n'ubọchi mb͕e M'napuru ha ebe-ha siri ike, bú ihe-obi-utọ nke ima-nma-ha, na ihe anya-ha abua nāchọsi ike, na ihe ha buliworo nkpuru-obi-ha nye, bú umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom,


M'gēme kwa ka ala-unu ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, npako nke ike-ya gākwusi kwa; ugwu nile nke Israel gātọb͕ọ kwa n'efu, ghara inwe onye nāgabiga ha.


M'gēme kwa ka ndi ọjọ nke mba di iche iche bia, ha ewe nweta ulo nile ha: M'gēme kwa ka npako nke ndi di ike kwusi; agēme kwa ka ebe nsọ nile ha ghara idi nsọ.


O we si ha, Meruanu ulo a, me ka ndi eb͕uru eb͕u ju ogige-ya nile: puanu. Ha we pua, tib͕ue n'obodo.


Ogwe-aka ufọdu gēsite kwa n'akuku-ya guzo, me ka ebe nsọ ahu ghara idi nsọ, bú ebe ahu siri ike, ha gēwezuga kwa àjà-nsure-ọku ahu anēsure mb͕e dum, ha gēdo kwa ihe-árú nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu.


Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M'gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua.


M'egetiji nweli-elu nke ike-unu; M'gēme kwa elu-igwe-unu ka ọ di ka ígwè, me kwa ala-unu ka ọ di ka ọla:


Jehova gēbipuru onye ahu nke nēme nka onye nēteta eteta na onye nāza aza, n'ulo-ikwū nile nke Jekob, ya na onye nēwetara Jehova nke usu nile nke ndi-agha nso onyinye-inata-iru ọma.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan