Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 24:16 - Bible Nso

16 Nwa nke madu, le, M'gaje iwere ihe-otiti napu gi onye ahu nke anya-gi nāchọsi ike: ma i gaghi-eti aka n'obi, i gaghi-akwa kwa ákwá, anya-miri agaghi-ab͕a kwa gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “Nwa nke mmadụ, ana m aga iwere ihe otiti napụ gị onye ahụ ihe ya na-atọ gị ụtọ. Ma mgbe o mere, ị gaghị eti aka nʼobi maọbụ kwaa akwa. Anya mmiri agakwaghị esi gị nʼanya pụta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 24:16
17 Iomraidhean Croise  

Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu: Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.


N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.


Dika nne-ele nke nāhu n'anya na nne-ewu-ọhia mara nma, Ka ara-ya abua nēju gi afọ na mb͕e nile; Nání n'ihu-n'anya-ya ka i ganāwaghari mb͕e nile.


Mu onwem bu nke onye ihe-ya nātọm utọ, N'arum ka ọchichọ-ya di kwa.


Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.


N'ihi na otú a ka Jehova siri, Abala n'ulo nke ikwa-ozu, eje-kwa-la iti aka n'obi, egosi-kwa-la ha ebere i nwere n'aru ha: n'ihi na ewepuwom udom n'ebe ndi nka nọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ebere na obi-ebere nile.


Unu akwalara onye nwuru anwu ákwá, unu egosi-kwa-la ya ebere unu nwere n'aru ya: kwasierenu onye-ije ahu ike; n'ihi na ọ gaghi-alata kwa ọzọ, ọ gaghi-ahu kwa ala amuru ya ọzọ.


N'ihi nka ka Jehova ji kwue okwu di otú a bayere Jehoiakim nwa Josaia, bú eze Juda, si: Ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, nwa-nnem nwoke! ma-ọbu, Éwù, nwa-nnem nwanyi! ha agaghi-etiri ya aka n'obi, si, Éwù, onye-nwe-ayi! ma-ọbu, Éwù, ebube-ya!


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na isim bu miri miri, asi anyam abua bu isi-iyi nke anya-miri, ka m'we kwa ákwá n'ehihie na abali bayere ndi eb͕uru eb͕u nke ada ndim!


ka ha me kwa ngwa, buliere ayi igo-ákwá, ka anya-miri we si n'anya-ayi rùda, ka miri we si kwa na mbubere-anya-ayi rùputa.


Obi-ha tikuru Onye-nwe-ayi nkpu: Gi mb͕idi ada Zaion, me ka anya-miri rùda dika osimiri ehihie na abali; Enyela onwe-gi izu-ike; ka nwa-anya-gi ghara ikwusi akwusi.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


M'we gwa ndi Israel okwu n'ututu; nwunyem we nwua n'anyasi: m'we me n'ututu dika ihe ahu si di enyerem n'iwu.


Ọ gaghi-emeru onwe-ya, ime onwe-ya ka ọ ghara idi nsọ, ebe ọ bu onye-nwe madu n'etiti umu-nna-ya.


Ma ayi achọghi ka unu ghara imara ihe bayere ndi nāda n'ura ọnwu, umu-nna-ayi; ka o we ghara iwuta unu, ọbuná dika ọ nēwuta ndi fọduru, ndi nēnweghi olile-anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan