Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 24:11 - Bible Nso

11 Guzo kwa ite ahu n'elu icheku-ọku-ya nēre ere mb͕e ihe nādighi ya, ka o we di ọku, ọla-ya ewe re ọku, iru-árú-ya ab͕aze kwa n'etiti ya, ka nchara-ya we gwusia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Sinyekwanụ ite ahụ ihe na-adịghị nʼime ya nʼọkụ, tutu ruo mgbe ọ nụrụ ọkụ, chagharịa, gbazee ihe niile na-abụghị ọla dị nʼime ya ga-asọpụtasị, nchara ya ga-agwụsịkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 24:11
21 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka akam biaghachi n'aru gi, M'gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M'gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi:


N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.


mb͕e Onye-nwe-ayi gāsachapuwori inyi umu-ndinyom Zaion, ṅachapu kwa ọbara Jerusalem n'etiti ya, site na Mọ nke ikpé, na site na Mọ nke nkpochapu.


N'ihi na edowom irum n'aru obodo a ime ya ihe ọjọ, ọ bughi ime ya ezi ihe, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'aka eze Babilon ka agēnye ya, ọ gēsure kwa ya n'ọku.


ndi Kaldea, bú ndi nēbuso obodo a agha, gābia kwa suye obodo a ọku, sure ya na ulo nile, nke ha sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nye Beal n'elu-ha, wusi-kwa-ra chi ọzọ di iche iche àjà-ihe-ọṅuṅu, ka ha we kpasuem iwe.


N'ihi na ọ buru na unu etib͕usia usu-ndi-agha nile nke ndi Kaldea ndi nēbuso unu agha, nání ndi adupúru adupú ewe fọdu n'etiti ha, ma ha gēbili, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya, we sure obodo a n'ọku.


ma ọ buru na i pukughi ndi-isi eze Babilon, agēnye kwa obodo a n'aka ndi Kaldea, ha gēsure kwa ya n'ọku, gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha.


Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.


o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Me ka nkú ba uba, muye ọku, sizue anu ahu, me ka ofé-ya lọ alọ, ka esure kwa ọkpukpu-ya nile.


M'gāwusa kwa unu miri di ọcha, unu ewe di ọcha: ọ bu iru-árú nile unu na arusi nile unu ka M'gēme unu ka unu si nime ha di ọcha.


N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan