Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:8 - Bible Nso

8 Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma ọ hapụghị mmụọ akwụna ahụ dị nʼime ya, bụ nke o bidoro nʼIjipt, nke bụ na mgbe ọ bụ agbọghọ ya na ndị ikom dinakọrọ, ha na-apịkwa ọnụ ara agbọghọ ya aka, na-awụkwasịkwa agụụ nke ọchịchọ ọjọọ ha nʼahụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:8
10 Iomraidhean Croise  

Eze we me ka adua ya ọdu, o we me umu-ehi abua nke ọla-edo; ọ si ha, Unu arigozuwo Jerusalem; le chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


Nání nmehie nile nke Jeroboam nwa Nebat, nke o jiri me ka Israel mehie, Jihu ewezugaghi onwe-ya n'iso ha, bú umu-ehi ọla-edo ahu nke di na Bet-el, na nke di na Dan.


Ha we rapu ihe nile Jehova, bú Chineke-ha, nyere n'iwu, ha we mere onwe-ha arusi awuru awu, bú umu-ehi abua, me kwa Ashera, kpọ isi ala nye usu nile nke ihe elu-igwe, fè Beal òfùfè.


Ọ we nara ya n'aka-ha, were ihe eji eb͕u eb͕ub͕u b͕ue ya, me ya ka ọ ghọ nwa-ehi akpuru akpu: ha we si, Ndia bu chi-gi, Israel, ndi mere ka i si n'ala Ijipt rigoputa.


M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n'icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n'ala Ijipt.


I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.


ha we kwa iko n'Ijipt; ọ bu mb͕e ha di na nwata ka ha kwara iko: n'ebe ahu ka abiagidere ara-ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha piri ọnu-ọnu ara-ha aka, bú nke ha nwere mb͕e ha di nāmaghi nwoke.


I gāṅu kwa ya, ṅusia ya, ọbuná ejùjù-ya nile ka i gāracha, ara-gi abua ka i gādọwapu: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ozu-ha we di n'amá nke obodo uku ahu, bú nke anākpọ Sọdọm na Ijipt n'uzọ nke Mọ Nsọ, ebe akpọgide-kwa-ra Onye-nwe-ha n'obe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan