Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:5 - Bible Nso

5 Ohola we kwa iko mb͕e ọ nọ n'okpurum; agu ndi nāhu ya n'anya we gua ya, bú ndi Asiria ndi bu ab͕ata-obi-ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 “Ohola na-agba akwụna mgbe ọ ka bụ nkem. O nwere agụụ ịkwa iko nʼebe ndị niile ọ hụrụ nʼanya nọ, bụ ndị dike nʼagha nke ndị Asịrịa,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:5
23 Iomraidhean Croise  

Ọ gārara kwa Israel nye n'ihi nmehie Jeroboam nile, nke o mehieworo, na nke o ji me ka Israel mehie.


ma i mewo ihe ọjọ kari ndi nile buru gi uzọ, i we je mere onwe-gi chi ọzọ di iche iche, na arusi a kpuru akpu, ikpasum iwe, i we tufuem n'azu gi:


O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.


n'ihi nmehie nile nke Jeroboam nke o mehiere, na nke o ji me ka Israel mehie; nime nkpasu-iwe-ya nke o ji kpasu Jehova, bú Chineke Israel, iwe.


Ọ we me ihe-árú nke-uku n'ijeso arusi di iche iche, dika ihe nile si di nke ndi-Amorait mere, ndi Jehova napuru ala-ha n'iru umu Israel.)


Pul, bú eze Asiria, we bia imegide ala ahu; Menahem we nye Pul nnù talent ọla-ọcha abua na ọgu iri, ka aka-ya we diyere ya ime ka ala-eze di ike n'aka-ya.


Ehaz we zigara Tiglat-pilesa, bú eze Asiria, ndi-ozi, si, Orù-gi na nwa-gi ka m'bu: rigota, zọputam n'aka eze Siria na n'aka eze Israel, ndi nēbili imegidem.


Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.


Ọkpukpọ-nku di n'ebe miri-ya nile di, ha gāta kwa ata: n'ihi na ala arusi di iche iche apiri api ka ọ bu, ha ji kwa ihe-egwu nile ha wi ara.


I we kwaso umu Asiria iko, n'ihi na afọ ejughi gi; e, i kwasoro ha iko, ma afọ ejughi kwa gi.


n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.


Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu.


Agu ha we gua ya mb͕e ọ nēle ha anya, o we zigara ha ndi-ozi rue Kaldea.


Agu ndikom-ha nākwa iko we gua ya, ndi anu-aru-ha bu anu-aru inyinya-ibu, uré-ha bu kwa uré inyinya.


Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba.


O we kwaso ha iko nke-uku, ndi arọputara arọputa nke umu Asiria ka ha nile bu: ma onye ọ bula nke agu ya guru ya, arusi nile ha ka o ji merua onwe-ya.


N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.


Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.


Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.


Efraim we hu ọria-ya, Juda hu-kwa-ra ọnyá-ya, Efraim we je Asiria, zigara eze, bú Jereb: ma onye ahu apughi igwọ unu, ọ gaghi-eme kwa ka ọnyá si n'aru-unu la.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan