Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:34 - Bible Nso

34 I gāṅu kwa ya, ṅusia ya, ọbuná ejùjù-ya nile ka i gāracha, ara-gi abua ka i gādọwapu: n'ihi na Mu onwem ekwuwo okwu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

34 Ị ga-aṅụ ya, ṅụchaa ihe dị nʼiko ahụ. Ị ga-atapịakwa iberibe ya niile, dọkasịakwa ara gị abụọ. Ekwuola m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:34
7 Iomraidhean Croise  

N'ihi na iko di n'aka Jehova, manya-vine nke di nime ya asuwo ufufu; O juputara na manya ejiri ihe gwa, O we si na nke ahu b͕aputa manya: N'ezie ọru-ala-ya nile, ndi nile n'uwa ndi nēmebi iwu gāzaputa ya ṅua.


Ma mu onwem, m'gēgosi oké ọlu-Gi rue mb͕e ebighi-ebi, M'gābùku Chineke nke Jekob abù ọma.


Teta, teta, bilie Jerusalem, nke siworo n'aka Jehova ṅua iko nke ọnuma-Ya; ọkwa ahu, bú iko nke isu-ngọngọ, ka i ṅuworo, ṅusia.


Obi-gi, ò gēguzo? ma-ọbu aka-gi abua, hà gādi ike n'ubọchi ndia mb͕e Mu onwem nēmeso gi? Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo, me kwa ya.


ha we kwa iko n'Ijipt; ọ bu mb͕e ha di na nwata ka ha kwara iko: n'ebe ahu ka abiagidere ara-ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ha piri ọnu-ọnu ara-ha aka, bú nke ha nwere mb͕e ha di nāmaghi nwoke.


Ma ikwa-iko-ya nile nke sitere n'Ijipt ka ọ nārapughi; n'ihi na ya na ha dinara mb͕e ọ di na nwata, ndi ahu pi-kwa-ra ọnu-ọnu ara-ya abua aka, bú nke o nwere mb͕e ọ di nāmaghi nwoke: ha we wukwasi ya ikwa-iko-ha dika miri.


Ka ha ra, bú otuto o nyere onwe-ya, na inupu-isi ọ nupuru, nyenu ya nmekpa-aru na iru-újú ra otú ahu: n'ihi na ọ nāsi n'obi-ya, Anamanọdu dika eze-nwanyi, abughikwa m nwanyi di-ya nwuru, ọ dighi kwa iru-újú m'gāhu ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan