O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.
Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.
I we chiri uwe-gi ufọdu, mere onwe-gi ebe di iche iche di elu nke aturu agwa, i we kwa iko n'elu ha: ihe di otú a ekwesighi ibia, ọ gaghi-adi kwa otú a.
n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.
M'gēnye kwa gi n'aka-ha, ha ewe kwatue ulo ikwa-iko gi, tikpọ ebe-gi nile di elu, yipu uwe-gi nile n'aru-gi, chiri ihe-gi nile mara nma: ha gārapu gi i b͕arasia ọtọ.
ha gēmeso kwa gi n'ikpọ-asì, wepu ihe nile i dọtara n'idọb͕u onwe-gi n'ọlu, ha gārapu kwa gi i b͕arasia ọtọ: agēkpughe kwa ọtọ nke ikwa-iko-gi nile, ma ajọ ihe-nzube-gi ma ikwa-iko-gi nile.
Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.