Izikiel 23:23 - Bible Nso23 bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a23 Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya. Faic an caibideil |
Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.