Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:23 - Bible Nso

23 bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Ndị Babilọn, ndị Kaldịa niile, ndị ikom Pekod, ndị Shoa, na ndị Koa, na ndị Asịrịa niile ha na ha soo. Ụmụ okorobịa niile dị mma ile anya, ha niile bụ ndị na-achị achị na ndị ọchịagha, ndịisi na-agba ịnyịnya, na ndị ikom ọkwa ha dị elu, ha niile ga-anọkwasị nʼelu ịnyịnya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:23
16 Iomraidhean Croise  

Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis.


Ha we biri site na Havila rue Shua nke di n'iru Ijipt, mb͕e i nēje Asiria: n'iru umu-nne-ya nile ka ọ dara ada.


Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.


ha we were ọṅù me ememe achicha ekoghi-eko ubọchi asa: n'ihi na Jehova mere ka ha ṅuria ọṅu, O me-kwa-ra ka obi eze Asiria chigharia n'ebe ha nọ, ime ka aka-ha di ike n'ije-ozi nke ulo Chineke, bú Chineke Israel.


Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.


Rigo megide ala Merataim, imegide ya, rigo kwa rue ndi bi na Pekod: b͕ue, wezuga kwa ka ebibie n'azu ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), me kwa dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Agu umu Asiria guru ya, bú ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, ndi bu ab͕ata-obi-ya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya, umu-okọrọbia anāchọsi ike ka ha nile bu.


O we tukwasi ihe n'ikwa-iko-ya; o we hu ndikom akàrari na mb͕idi, bú onyinyo ndi Kaldea eji ihe-otite nācha uhie uhie kà,


N'ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ndi nāhu gi n'anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ, M'gēme kwa ka ha si n'ebe nile di buruburu biakwasi gi;


ndi yiri uwe anunu, ha bu ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze, umu-okorọbia anāchọsi ike ka ha nile bu, ha bu ndi-inyinya nānọkwasi inyinya.


Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan