Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:22 - Bible Nso

22 N'ihi nka, Oholiba, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ndi nāhu gi n'anya imegide gi, bú ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ, M'gēme kwa ka ha si n'ebe nile di buruburu biakwasi gi;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “Nʼihi nke a, gị Oholiba, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Aga m akpali ndị ahụ hụrụ gị nʼanya megide gị, bụ ndị ahụ ihe ha na-amasịkwaghị gị ọzọ. Aga m esi nʼakụkụ niile kpọta ha, megide gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:22
11 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta ndi nile nāhu gi n'anya, ndi ihe-gi nātọ ha utọ, na ndi nile i huworo n'anya, ha na ndi nile i kpọworo asì; ọ bu na M'gāchikọta ha imegide gi buruburu, M'gēkpughe-kwa-ra ha ọtọ-gi, ka ha we hu ọtọ-gi nile.


I we leta ajọ ihe-nzube nke mb͕e i di na nwata, n'ipi ọnu-ọnu ara-gi abua nke ndi Ijipt piri n'ihi ara abua nke i nwere mb͕e i di na nwata.


bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje inye gi n'aka ndi i nākpọ asì, n'aka ndi nkpuru-obi-gi kewapuworo n'ebe ha nọ:


N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.


Mpi iri ahu i huru, ha na anu-ọhia ahu, ndia gākpọ nwanyi ahu nākwa iko asì, ha gēme kwa ya ka ọ buru onye tọb͕ọrọ n'efu buru kwa onye b͕a ọtọ, ha gēri kwa anu-aru-ya, rechapu kwa ya n'ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan