Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:18 - Bible Nso

18 O we kpughe ikwa-iko-ya nile, kpughe kwa ọtọ-ya: nkpuru-obim we kewapu n'aru ya, dika nkpuru-obim si ekewapu n'aru nwa-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ọ gara nʼihu na-akwa iko nʼezoghị ezo na-ekpughekwa ọtọ ya, elepụrụ m ya anya nʼihi ịsọ oyi, dịka m mere lepụkwara anya site nʼebe nwanne ya nwanyị nọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:18
20 Iomraidhean Croise  

Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya, O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú.


Chineke nuru nka, O we webiga iwe ókè, Jusie Israel ike:


Nmata ha nāmata iru madu n'ikpe azawo megide ha; nmehie-ha ka ha gosiwo-kwa-ra dika Sọdọm, ha ezobeghi ya. Ahuhu gādiri nkpuru-obi-ha! n'ihi na ha emesowo onwe-ha ihe ọjọ.


Ọ bu kwa n'azu ọnu-uzọ-gi na akuku-ọnu-uzọ-gi ka i doworo ihe-ncheta-gi: n'ihi na mb͕e M'nānọghi ka i kpupuru ihe-ndina-gi, we rigo: i mere ka ihe-ndina-gi sa mbara, we soro ha b͕ara onwe-gi ndu; i huru ihe-ndina-ha n'anya; aka-ha ka i huru.


Ihe-nketam aghọworom ihe dika ọdum n'oké ọhia: o mewo ka olu-ya da megidem; n'ihi nka ka M'kpọworo ya asì.


Jehova we sim, Ọ buru na Moses na Samuel eguzo n'irum, nkpuru-obim agaghi-adi n'ebe ndi nka nọ: chupu ha n'irum, ka ha pu kwa.


Ka adọ gi aka na nti, Jerusalem, ka nkpuru-obim we ghara ikewapu n'ebe i nọ; ka M'we ghara ime gi ebe tọb͕ọrọ n'efu, ala onye ọ bula nēbighi.


ọ̀ di ihere mere ha megbe ha mere ihe-árú? é-è, ihere adighi-eme ha ma-ọli, ọ dighi kwa itiye-n'ọnọdu-ihere ha mara: n'ihi nka ha gāda n'etiti ndi nāda ada: na mb͕e eletara ha ha gāsu ngọngọ, ka Jehova siri.


Onye-nwe-ayi ajusiwo ebe-ichu-àjà-Ya, Ọ sọwo ebe nsọ Ya oyi, O mechibidowo mb͕idi nile nke ulo-elu-ya nile nye n'aka onye-iro: Ha emewo ka olu-ha da udà n'ulo Jehova, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, N'ihi na awusiwo ọla-gi, na n'ihi na ekpughepuru ọtọ-gi site n'ikwa-iko-gi nile i nākwaso ndi nāhu gi n'anya; na n'ihi arusi nile nke ihe-árú-gi nile, na dika ọbara umu-gi si di, nke i nyere ha;


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n'omume nile unu; n'ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n'ọbu-aka ka agējide unu.


Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya.


O we me ka ikwa-iko-ya nile ba uba, n'icheta ubọchi nile ọ di na nwata, mb͕e ọ kwara iko n'ala Ijipt.


N'ihi nka ka M'nyere ya n'aka ndi nāhu ya n'anya, n'aka umu Asiria, ndi agu ha guru ya.


Unu na nne-unu kpe ikpe, kpenu; n'ihi na ya onwe-ya abughi nwunyem, Mu onwem abughi kwa di-ya: ya wezuga ikwa-iko-ya nile n'iru ya, ya wezuga kwa ikwa-iko nile nke nwanyi nwere di ọ nākwa n'etiti ara-ya abua;


Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.


Akpọwom ememe nile unu asì, ju ha, M'gaghi-anu kwa ísì utọ n'ubọchi-nb͕ochi nile unu.


Onye-nwe-ayi Jehova ejiwo Onwe-ya ṅua iyi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, puta), si: Mu onwem nākpọ npako Jekob ihe-árú, ọ bu kwa ulo-elu-ya nile ka M'kpọworo asì: M'gēmechibido kwa obodo na ùjú-ya nye n'aka onye-iro.


M'we bipu ndi-ọzùzù-aturu atọ ahu n'otù ọnwa; nkpuru-obim enweghi kwa ntachi-obi n'aru ha, ọzọ, nkpuru-obi-ha asọwokwam oyi.


Jehova we hu ya, we lelia ha anya, N'ihi nkpasu-iwe nke umu-Ya ndikom na umu-Ya ndinyom.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan