Nwayi we hu na osisi ahu di nma ihe-oriri, na ọ bu kwa ihe nāgu anya agu ile, na ihe anāchọsi ike ka osisi ahu bu kwa ime ka madu nwe uche, o were ufọdu nime nkpuru-ya, rie; o nye kwa di-ya, tinyere onwe-ya, o we rie.
O rue, na mb͕e anyasi, na Devid siri n'ihe-ndina-ya bilie, jegharia n'elu ulo eze: o we si n'elu ulo ahu hu otù nwayi ka ọ nāsa aru: ma nwayi ahu di nma nke-uku n'ile anya.
I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.
ndi ekereri ihe-ọkiké n'úkwù-ha, ndi ejiri ákwà esijiri esiji kebiga isi-ha ókè, n'ile ha anya ndi-isi-agha ka ha nile bu, dika oyiyi umu Babilon nke Kaldea, bú ala amuru ha.
ha bu ndi nwere anya nke juputara n'aru nwanyi nākwa iko, anya nke nāpughi kwa ighara imehie; ha bu kwa ndi nārafu nkpuru-obi ndi nādighi-eguzosi ike; ha nwekwara obi anwaputaworo n'anya-uku; buru kwa umu nke ọbubu-ọnu;