Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 23:11 - Bible Nso

11 Nwa-nne-ya nwanyi, bú Oholiba, we hu nka, ma o bibiri onwe-ya kari nwa-nne-ya n'agu ndikom nke guru ya, na n'ikwa-iko-ya nile nke kariri ikwa-iko nile nke nwa-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 “Oholiba bụ nwanne ya nwanyị hụrụ ihe ndị a, ma nʼime agụụ ihe ọjọọ nke gụrụ ya nakwa ịgba akwụna, ọ kpara agwa jọrọ njọ karịa nke nwanne ya nwanyị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 23:11
6 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ihe ra ka ọnwa atọ gasiri, na egosiri Juda, si, Tema, bú nwunye nwa-gi, akwawo iko; ọzọ kwa, le, ọ di ime site n'ikwa-iko. Juda we si, Me ka ọ puta, ka esure ya ọku.


Onye ahu me-kwa-ra ebe di elu n'ugwu nile nke Juda, we me ndi bi na Jerusalem ka ha kwa iko, ọ rafu-kwa-ra Juda.


Jehova we sim n'ubọchi Josaia, bú eze, Ì huwo ihe Israel nke nādaghachi azu meworo? nwayi ahu nēje n'elu ugwu ọ bula di elu, na n'okpuru osisi ndu ọ bula, we nākwa iko n'ebe ahu.


Ma aha-ha bu Ohola, ya bu nke-okenye, na Oholiba, bú nwa-nne-ya: ha we ghọ ndi nkem, mua umu-ndikom na umu-ndinyom. Ma aha-ha, Sameria bu Ohola, Jerusalem bu Oholiba.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan