Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 22:20 - Bible Nso

20 Dika esi achikọta ọla-ọcha na ọla na ígwè na opù na b͕amb͕am n'etiti oké ọku, ifunwu ya ọku, ib͕aze ya; otú a ka M'gāchikọta unu n'iwem na n'ọnumam, tọb͕ọ unu n'ebe ahu, b͕aze unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Dịka a na-achịkọta ọlaọcha, na ọla, na igwe, na opu, na gbamgbam, tinye ha nʼoke ọkụ ka ha gbazee, otu a ka m ga-esite nʼiwe m na ọnụma m chịkọtaa unu nʼime obodo ahụ gbazee unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 22:20
12 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka akam biaghachi n'aru gi, M'gānuchapu kwa afuru-uzu-gi, dika eji akanwu me, M'gēwezuga kwa ihe nile gwara agwa nime gi:


Le, Mu onwem ekèwo uzú nke nāfù ọku icheku, nākpu ihe-ọlu iji lu ọlu nke aka ya; Mu onwem ekèwo kwa onye-nbibi imebi emebi.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


M'gēkpochapusi ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-vine adighi n'osisi vine, ọ dighi fig di n'osisi fig, akwukwọ akpọnwuwo kwa; M'we doro ha ndi nāgabiga ha n'isi.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na unu nile aghọwo afuru-uzu, n'ihi nka, le, M'gaje ichikọta unu n'etiti Jerusalem.


E, M'gākpọkọta unu, were ọku nke nrubiga-ókè nke iwem fukwasi unu, unu ewe b͕aze n'etiti ya.


M'we wukwasi ha ajọ iwem dika miri; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'jiworo me ka ha gwusia: uzọ-ha ka M'tiyekwasiworo n'isi-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'iru-árú-gi ka ajọ nzube di: n'ihi na emewom ka i di ọcha ma i dighi ọcha, i gaghi-esi kwa n'iru-árú-gi di ọcha ọzọ, rue mb͕e M'gēmewori ka ọnumam zuru ike n'aru gi.


M'we wukwasi ha ọnumam n'ihi ọbara ahu nke ha wukwasiri n'ala-ha, na n'ihi na ha jiri arusi nile ha merua ya:


E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan