Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 22:13 - Bible Nso

13 Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 “ ‘Lee, aghaghị m ịkụkọta ọbụ aka m abụọ nʼihi uru nke na-ezighị ezi ị na-eri, na ọbara niile nke ị wụsiri nʼetiti gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 22:13
16 Iomraidhean Croise  

Onye nēme ka àkù-ya ba uba site n'inara uma na ọmuru-nwa, Ọ nēkpokọta ya nye onye nēmere ndi nēnweghi ike amara.


Ọ bu onye nējeghari n'ezi omume nile, nke nēkwu kwa okwu nile ziri ezi; nke nāju urù nmeb͕u nile, nke nētichapu ọbu-aka-ya abua n'ijide ihe-iri-ngo, nke nākwuchi nti-ya abua ka ọ ghara inu okwu bayere iwusi ọbara, nke nātachi kwa anya-ya abua ka ọ ghara ilekwasi ihe ọjọ anya;


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu.


Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n'otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n'isi uzọ obodo.


Ndi-isi-ya n'etiti ya di ka anu-ọhia ọdum nādọb͕u anu-ndọb͕u; iwusi ọbara, ime ka nkpuru-obi madu la n'iyì, ka ha we rita urù nēzighi ezi.


Ha we nābiakute gi dika ọbibia nke otù ndi, nọdu ala n'iru-gi dika ndim, ha nānu kwa okwu-gi nile, ma okwu-gi ndia ka ha nēmegh: n'ihi na ihu-n'anya riri nne ka ndi ahu ji ọnu-ha egosi, ma urù-ha nke nēzighi ezi ka obi-ha nējeso.


N'ihi na ha amaghi ime ihe ziri ezi, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), bú ndi nākpakọba ihe-ike na ipunara-madu-ihe n'ulo-elu nile ha.


Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.


ka onye ọ bula ghara ighọb͕u na irib͕u nwa-nna-ya n'ihe a: n'ihi na Onye-nwe-ayi bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ bayere ihe ndia nile, dika ayi bu-kwa-ra uzọ gwa unu gwasi kwa unu ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan