Izikiel 22:12 - Bible Nso12 Ngo ka ha riworo nime gi iwusi ọbara; uma na ọmuru-nwa ka i naraworo, i we were nmeb͕u rita urù nēzighi ezi n'aka madu-ibe-gi nile, ma Mu onwem ka i chezọworọ, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 E nwekwara ndị na-anara ego gbuo mmadụ ibe ha nʼime gị. Gị onwe gị na-anarakwa ndị i binyere ego ụma buru ibu, na-esitekwa nʼaka ike na-anara ndị mmadụ ihe ha. I chefuokwala m. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. Faic an caibideil |
ma otú ọ di, edegaram unu ka unu na onye ọ bula nke anākpọ ya aha na ọ bu nwa-nna ghara imekọ ihe, ma ọ buru na onye ahu bu onye nākwa iko, ma-ọbu onye-anya-uku, ma-ọbu onye nēkpere arusi, ma-ọbu onye-nkwutọ, ma-ọbu onye nāṅubiga manya ókè, ma-ọbu onye nāpunara madu ihe; ka unu na onye di otú a ghara ọbuná irikọ ihe.