Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 22:11 - Bible Nso

11 Ọzọ, otù nwoke esorowo nwunye nke madu-ibe-ya me ihe-árú; nwoke ọzọ emeruwo nwunye nwa-ya n'ajọ ihe-nzube; nwoke ọzọ ewedawo nwa-nne-ya nwayi, bú nwa nke nna-ya, n'ala nime gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼime gị ka otu nwoke na-eme ihe arụ ya na nwunye onye agbataobi ya, onye ọzọ na-enweghị ihere emerụọla nwunye nwa ya, onye ọzọkwa, emerụkwala nwanne ya nwanyị, bụ ada nke nna ya mụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 22:11
25 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.


Ọ chita ha nso ya ka o rie, Amnon we jide ya, si ya, Bia, sorom dina, nwa-nnem.


Ma ọ kweghi ige nti olu-ya: ọ di kwa ike kari ya, ọ we weda ya n'ala, soro ya dina.


n'ihi na ha emewo ihe-nzuzu n'Israel, we kwa nwunye ndikom-ibe-ha iko, kwu kwa okwu n'aham n'ugha, bú nke M'nēnyeghi ha n'iwu; ma Mu onwem bu onye mara, na onye-àmà; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na m'nwere ebe inọ ọnọdu-abali nke ndi-ije n'ọzara; ka m'we rapu ndim, si n'ebe ha nọ la! n'ihi na ha nile bu ndi nākwa iko, nzukọ ndi-nghọb͕u.


ma ezi ihe ndia nile ka ọ nēmeghi, n'ihi na ọbuná n'ugwu ka o riworo ihe, ọ bu kwa nwunye madu-ibe-ya ka o meruworo,


asi na ọ bu onye nērighi ihe n'ugwu, nke nēwelighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, nke nēmerughi nwunye madu-ibe-ya, nke nādighi-abia nso nwanyi di na nsọ;


Unu eguzowo n'elu mma-agha-unu, unu emewo ihe-árú, unu emeruwo, nwoke ọ bula o merua nwunye nke nwoke-ibe-ya: ọ̀ bu kwa ala nka ka unu gēnweta?


Ekpughela ọtọ nwunye nwa-gi: nwunye nwa-gi ka ọ bu; ekpughela ọtọ-ya.


Gi na nwunye madu-ibe-gi edinala ka i ra aru n'aru-ya, iwere ya meru onwe-gi.


Nwoke ọ bula abiarula nso onye-aru-ya ọ bula, ikpughe ọtọ-ya: Mu onwem bu Jehova.


Ọtọ nwa-nne-gi nwayi, bú nwa nke nna-gi ma-ọbu nwa nke nne-gi, nke amuru n'ulo, ma-ọbu nke amuru n'èzí, ekpughela ọtọ-ha.


Nwoke nke ya na nwunye nwoke ọzọ nākwa iko, bú onye ya na nwunye madu-ibe-ya nākwa iko, aghaghi ime ka ha nwua, bú nwoke ahu nākwa iko, na nwayi ahu nākwa iko.


Nwoke ọ bula nke ya na nwunye nwa-ya nēdina, aghaghi ime ka ha abua nwua: ngwakọta ọjọ ka ha meworo; ọbara-ha gādikwasi ha.


Nwoke ọ bula nke nēkuru nwa-nne-ya nwayi, bú nwa-nwayi nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nne-ya, we hu ọtọ-ya, nwayi ahu we hu ọtọ-ya; ihe-ihere ka ọ bu; agēbipu kwa ha n'anya umu ndi-ha: ọtọ nwa-nne-ya nwayi ka o kpugheworo; o gēbu ajọ omume-ya.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma-ọbu ùnu amataghi na ndi ajọ omume agaghi-eketa ala-eze Chineke? Unu ekwela ka eduhie unu: ndi nākwa iko, ma-ọbu ndi nēkpere arusi, ma-ọbu ndikom nākwa iko, bú ndi nwere nwunye, ma-ọbu ndikom nēme dika ndinyom, ma-ọbu ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom,


Ma ọlu nile nke anu-aru putara ìhè, nke di ka ndia, ikwa-iko, adighi-ọcha, agu ikwa-iko,


Mb͕e agāhuta nwoke ka ya na nwayi nēdina, bú nwayi nke di lutaworo, ha abua gānwu kwa, bú nwoke ahu nke ya na nwayi ahu nēdina, na nwayi ahu: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'Israel.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye ya na nwa-nne-ya nwayi nēdina, bú nwa-nwayi nke nna-ya, ma-ọbu nwa-nwayi nke nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan