Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 21:26 - Bible Nso

26 otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Wezuga ákwà-nkukù-isi ahu, bupu okpu-eze ahu: nka agaghi-abu kwa ihe ọ bu: me ihe nke di ala ka ọ di elu, me kwa ihe nke di elu ka ọ di ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

26 ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 21:26
18 Iomraidhean Croise  

O rue, n'arọ nke-orú-na-iri-na-asa nke emere ka Jehoiakin, bú eze Juda, je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri-na-abua, n'ubọchi nke-orú-na-asa nke ọnwa ahu, na Evil-merodak, bú eze Babilon, n'arọ ọ malitere ibu eze, o siri n'ulo-nkpọrọ welie isi Jehoiakin, bú eze Juda;


Ha we jide eze, me ka ọ rigokuru eze Babilon rue Ribla; ha we kwue okwu ikpé n'ebe ọ nọ.


Kama Chineke bu onye-ikpe: Ọ nēme otù onye ka ọ di ala, Ọ nēbuli kwa onye ọzọ elu.


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka àkù di; Okpu-eze kwa, ọ̀ nādiru ọb͕ọ nile?


Biko, guzo n'ọlu dibia-nrafu nile i nālu, na n'ọtutu mb͕asi-gi, nke i dọb͕uworo onwe-gi n'ọlu nime ha site na mb͕e i nọ na nwata; eleghi anya i gēnwe ike ibà urù, eleghi anya i geme ka madu ma jijiji.


Si eze, si kwa eze-nwayi, Menu onwe-unu ka unu di ala, nọdunu ala: n'ihi na ihe-isi nile nke unu adapuwo, bú okpu-eze nke ima-nma-unu.


Okpu-eze nke isi-ayi adawo n'ala: Ahuhu nādiri ayi nọ̄! n'ihi na ayi emehiewo.


M'we tiye nb͕a-aka n'imi-gi, na nb͕a-aka-nti na nti-gi abua, na okpu-eze mara nma n'isi-gi.


Osisi nile nke ọhia ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, emewo ka osisi nke di elu di ala, emewom ka osisi nke di ala di elu, emewom ka osisi nke di ndu kpọnwua, emewom ka osisi nke kpọnwuru akpọnwu ma ifuru: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo me kwa ya.


O wedawo ndi di ike pua n'oche-eze-ha, Weli kwa elu ndi ọnọdu-ha di ala.


Wedanu onwe-unu n'iru Onye-nwe-ayi, Ọ gēweli kwa unu elu.


Nwoke ahu, bú Maika, we nwe ulo Chineke, o we me ephod na teraphim, mejue aka nke otù nime umu-ya ndikom, o we ghọrọ ya onye-nchu-àjà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan