Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 21:25 - Bible Nso

25 Ma gi onwe-gi, onye emeruworo aru, onye nēmebi iwu, bú onye-isi Israel, onye ubọchi-ya biaworo, na mb͕e ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 21:25
21 Iomraidhean Croise  

Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.


Onye-nwe-ayi nāchì ya ọchì: N'ihi na Ọ huwo na ubọchi-ya nābia


Tukwasinu obi-unu n'ékpè-ya, Tulenu ulo nile ya di elu; Ka unu we kọrọ ọb͕ọ nēso n'azu.


Biko, kwe ka ihe ọjọ nke ndi nēmebi iwu gwusia, ma me ka onye ezi omume guzosie ike: N'ihi na onye nānwa obi nile na akuru nile ka Chineke, bú Onye ezi omume, bu.


Ma dika fig ọjọ ndia, nke anāgaghi-eri eri, site n'ijọ-njọ-ha; n'ezie otú a ka Jehova siri, Otú a ka M'gēwere Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya, na ndi Jerusalem fọduru, bú ndi fọduru n'ala nka, na ndi bi n'ala Ijipt, nye:


Nke diri umu Amon. Otú a ka Jehova siri: Ọ̀ dighi umu-ndikom Israel nwere? ọ̀ dighi onye-nnweta ihe-ya o nwere? Gini mere Malkam ji nweta Gad, ndi-ya we biri n'obodo-ya nile?


N'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e M'gēme ka anuru udà-opì agha rue Raba nke umu Amon; ọ gāghọ kwa obo ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa umu-ya ndinyom ka agēji ọku sure: Israel ewe nweta ndi nwetara ya-ri; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gi onye bi n'elu ọtutu miri, onye nwere ọtutu àkù, ọgwugwu-gi abiawo, bú ọtùtù nke urù-gi nēzighi ezi.


O mee ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ihe nile si di nke Jehoiakim mere.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M'gātukwasi kwa ya n'isi-ya.


Tie nkpu, kwasie ákwá ike, nwa nke madu: n'ihi na nke ahu di n'aru ndim, nke ahu di n'aru ndi-isi Israel: ndi arara nye mma-agha ka ha na ndim bu: n'ihi nka tie aka n'apata-ukwu-gi.


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na unu emewo ka echeta ajọ omume unu, nime nkpughe njehie nile unu, ewe hu nmehie nile unu n'omume nile unu; n'ihi na emewo ka echeta unu, ọ bu n'ọbu-aka ka agējide unu.


mb͕e ha nāhuru gi ọhù efu, mb͕e ha nājuru gi ase okwu-ugha, itiye gi n'olu ndi nēmebi iwu ndi eb͕uru eb͕u, ndi ubọchi-ha abiawo, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu.


M'gēme kwa ka Raba ghọ ebe-obibi nke camel, me kwa ka umu Amon ghọ ebe-nmakpu nke ìgwè ewu na aturu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


N'ihi na ubọchi di nso, ọ di nso, bú ubọchi Jehova nwere, ọ bu ubọchi igwe-oji; mb͕e nke mba di iche iche ka ọ gābu.


N'ihi na i nwere iro ebighi-ebi, we rara umu Israel nye n'aka mma-agha na mb͕e nhuju-anya-ha, na mb͕e nke ajọ omume nke mb͕e ikpe-azu:


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu.


Ub͕u a ka ọgwugwu dikwasi gi, M'gēzite kwa iwem n'aru gi, kpe gi ikpe dika uzọ-gi nile si di; M'gētiyekwasi kwa gi ihe-árú-gi nile.


Ọgwugwu abiawo, ọgwugwu ahu abiawo, o tetawo n'ebe i nọ; le, ọ nābia.


ma M'gēsuye ọku na mb͕idi Raba, ọ gēripia kwa ulo-elu-ya nile, n'iti-nkpu agha n'ubọchi agha, n'oké ifufe n'ubọchi oké ikuku:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan