18 Okwu Jehova we ruem nti, si,
18 Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, mere onwe-gi uzọ abua, ka mma-agha nke eze Babilon we bia; n'otù ala ka ha abua gēsi puta: gi ka kwa akàrà yiri aka madu, ka ya n'isi uzọ obodo.