Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 21:17 - Bible Nso

17 Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m, ime ka iwe m jụrụ. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 21:17
13 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom:


N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.


Apula ibà n'ọhia, eje-kwa-la ije n'uzọ; n'ihi na onye-iro nwere mma-agha, ujọ di buruburu.


M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru gi, ekworom gēsi kwa n'aru gi wezuga onwe-ya, M'gānọ kwa jū, ghara iwe iwe ọzọ.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, bue amuma, kukọta ọbu-aka-gi abua; ka mma-agha di okpukpu atọ, bú mma-agha nke ndi anēb͕u eb͕u: nke ahu bu mma-agha nke onye uku ahu nke anēb͕u eb͕u, nke nāb͕achibido ha buruburu.


Me onwe-gi ka i di otù, ga n'aka-nri; do onwe-gi n'usoro, ga n'akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Ma, le, akuwom ọbu-akam n'ebe urù-gi nēzighi ezi nke i ritaworo di, na n'ihi ọbara-gi nke diworo n'etiti gi.


Unu gēcheta kwa uzọ ọjọ nile unu, na omume nile unu nke nādighi nma; unu gāsọ kwa onwe-unu oyi n'anya-unu n'ihi ajọ omume nile unu na n'ihi ihe-árú nile unu.


Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.


O we kpọsiem òkù ike gwam okwu, si, Le, Ndi ahu nke nāpu rue ala Ugwu emewo ka Mọm zue ike n'ala Ugwu.


Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.


Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan