Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 21:16 - Bible Nso

16 Me onwe-gi ka i di otù, ga n'aka-nri; do onwe-gi n'usoro, ga n'akpa-ekpe; ebe ọ bula akaworo iru-gi àkà iga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla, ma ọ nọ gị nʼaka nri ma ọ nọ gị nʼaka ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 21:16
8 Iomraidhean Croise  

Ala nka nile, ọ̀ dighi n'iru gi? biko, kewapu onwe-gi n'arum: ọ buru aka-ekpe, m'gēje kwa n'aka-nri: ma ọ buru aka-nri, m'gēje kwa n'aka-ekpe.


Ma-ọbu, asi na ọ bu mma-agha ka M'nēme ka ọ biakwasi ala ahu, M'we si, Ka mma-agha gabiga n'ala nka; M'we bipu madu na anumanu nime ya;


Nwa-nne-gi nwanyi nke-okenye bu Sameria, nke bi n'aka-ekpe-gi, ya onwe-ya na umu-ya ndinyom: nwa-nne-gi nwanyi nke-ntà, nke bi n'aka-nri-gi, bu Sọdọm na umu-ya ndinyom.


Ọ bu n'akuku ọnu-uzọ-ama nile ha ka M'tiyeworo ọnu-ọnu mma-agha, ka obi we lọ ha miri, ka ewe me kwa ka ihe-isu-ngọngọ ba uba: ewó! emewo ya ka ọ ghọ àmùmà, amuru ya amu ib͕u eb͕u.


Ọzọ, Mu onwem gākukọta kwa ọbu-akam abua, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


Uzọ ka i gēme, ka mma-agha we biarue Raba nke umu Amon, ru kwa Juda nime Jerusalem, bú ebe ewusiri ike.


Ebe M'gēbipu nime gi onye ezi omume na onye nēmebi iwu, n'ihi nka ka mma-agham gēsi n'ọbọ-ya puta imegide anu-aru nile, bú madu, site na Ndida rue Ugwu:


N'ihi na Mu onwem gēzite ajọ ọria nēfe efe na ọbara nime ya n'èzí-ya nile; ndi eb͕uru eb͕u gāda kwa n'etiti ya mb͕e mma-agha di n'aru ya buruburu; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan