Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 20:44 - Bible Nso

44 Unu gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, mb͕e M'mesoworo unu n'ihi aham, ọ bughi dika uzọ ọjọ nile unu si di, ọ bughi kwa dika omume nile unu nke bibiri ebibi, unu ulo Israel; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

44 Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m mesochara unu mmeso nʼihi aha m, na-agụghị ajọ omume unu maọbụ otu ụzọ ọjọọ niile unu si dị, unu bụ ụlọ Izrel. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 20:44
12 Iomraidhean Croise  

Ọ bughi ayi, Jehova, ọ bughi ayi, Kama ọ bu aha-Gi ka I gēnye nsọpuru, N'ihi ebere-Gi, na n'ihi ezi-okwu-Gi.


Yere ayi aka, Chineke nke nzọputa-ayi, n'ihi nsọpuru aha-Gi: Naputa kwa ayi, kpuchi kwa nmehie-ayi, n'ihi aha-Gi.


Mu onwem gēme kwa ka ọb͕ub͕a-ndum nke Mu na i b͕ara guzosie ike; i we mara na Mu onwem bu Jehova:


M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha.


Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.


M'gāsachapu kwa ndi nānupu isi na ndi nējehie megidem n'etiti unu; n'ala ebe ha nọ dika ọbìa ka M'gēme ka ha si puta, ma ọ bughi n'ala Israel ka ha gābà: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.


Ezikiel ewe ghọrọ unu ihe-ebube; dika ihe nile nke o meworo si di, otú a ka unu gēme: mb͕e nka gābia, unu ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.


ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:


otú ọ di, ọ bu n'ihi nka ka emerem ebere, ka o we buru nime mu onwem, bú onye-isi, ka Jisus Kraist gēgosi ogologo-ntachi-obi-Ya nile, ka m'buru ihe ilere anya n'etiti ndi gaje ikwere na Ya ka ha nata ndu ebighi-ebi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan