Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 20:14 - Bible Nso

14 M'we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha si n'ala Ijipt puta n'anya-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma nʼihi aha m, e mere m ihe ga-eme ka a ghara ime ya ka ọ hapụ ịdị nsọ nʼanya ndị mba niile, bụ ndị hụrụ mgbe m si Ijipt kpọpụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 20:14
9 Iomraidhean Croise  

N'ihi Mu onwem, n'ihi Mu onwem, ka M'gēme ya; n'ihi na le ka esi me ka aham ghara idi nsọ nke-uku! M'gaghi-enye kwa onye ọzọ nsọpurum.


Ulo Israel we nupu isi n'okpurum n'ọzara: ọ bughi n'ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam n'ọzara, ime ka ha gwusia.


Ọzọ kwa, Mu onwem weliri akam nye ha n'ọzara, si, na M'gaghi-eme ka ha ba n'ala ahu nke M'nyere ha, nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, ima-nma ka ọ buru ala nile;


Ma eseghachirim akam, we lua ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi M'mere ka ha puta n'anya-ha.


Ma alurum ọlu n'ihi aham, ka ewe ghara ime ya ka ọ ghara idi nsọ n'anya mba nile, ndi ha onwe-ha nọ n'etiti ha, ndi M'mere ka ha maram n'anya-ha, n'ime ka ha si n'ala Ijipt puta.


Aha nsọm ka M'gēme kwa ka amara ya n'etiti ndim, bú Israel; M'gaghi-ekwe kwa ọzọ ka eme ka aha nsọm ghara idi nsọ: mba nile ewe mara na Mu onwem bu Jehova, Onye nsọ nọ n'Israel.


ka ayi we buru ihe agēji to ebube-Ya, ayi ndi leworo anya Kraist na mbu:


ka ewe to ebube nke amara-Ya, bú nke O were amara me ka ayi nara n'aka-Ya nime Onye ahu Ọ huru n'anya:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan