Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 20:11 - Bible Nso

11 M'we nye ha ukpurum nile, me ka ha mara ikpém nile, nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Nʼebe ahụ ka m nọ nye ha iwu m niile, gosikwa ha ụkpụrụ m, gwa ha na onye ọbụla debere ha ga-adị ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 20:11
18 Iomraidhean Croise  

N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu:


nke nējeghari n'ukpurum nile, nke debeworo ikpém nile, ime ihe n'ezi-okwu; onye ezi omume ka onye ahu bu, ọ ghaghi idi ndu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ulo Israel we nupu isi n'okpurum n'ọzara: ọ bughi n'ukpurum nile ka ha jeghariri, ikpém nile ka ha ju-kwa-ra, bú nke madu gādi kwa ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ ma-ọli: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam n'ọzara, ime ka ha gwusia.


Umu-ha we nupu isi n'okpurum; ha ejeghi ije n'ukpurum nile, ha edebeghi kwa ikpém nile ime ha, bú nke madu gādi ndu nime ha, ma o me ha; ubọchi-izu-ikem nile ka ha mere ka ha ghara idi nsọ: M'we si na M'gāwukwasi ha ọnumam, imezu iwem megide ha n'ọzara.


asi na onye nēmebi iwu enyeghachi ihe-ibe, kwughachi ihe ọ punara madu n'ike, jegharia n'ukpuru nile nke ndu, ghara ime ajọ omume; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.


Unu gēdebe kwa ukpurum nile na ikpém nile: nke madu gēme, di ndu nime ha: Mu onwem bu Jehova.


O we si ya, I zara nke-ọma: me nka, i gādi kwa ndu.


N'ihi na Moses edewo n'akwukwọ na madu nke nēme ezi omume nke sitere n'iwu gādi ndu nime ya.


Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi.


ma iwu ahu esiteghi n'okwukwe; kama, Onye nēme ihe ndia gādi ndu nime ha.


Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:


Ma ub͕u a, Israel, ge nti ukpuru nile, ge kwa nti ikpé nile, nke mu onwem nēzí unu, ime ha; ka unu we di ndu, we ba, nweta kwa ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, nēnye unu.


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Òle mba uku di kwa, nke nwere ukpuru na ikpé ziri ezi dika iwu a nile, nke Mu onwem nētiye n'iru unu ta?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan