Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 2:8 - Bible Nso

8 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, nu ihe Mu onwem nāgwa gi; abula onye nānupu isi dika ulo ahu nke nānupu isi: saghepu ọnu-gi, rie ihe ahu nke Mu onwem nēnye gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ma gị, nwa nke mmadụ, gee ntị nʼihe m na-agwa gị. Enupula isi dịka ha si nupu isi. Meghee ọnụ gị taa ihe m ga-etinye gị nʼọnụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 2:8
19 Iomraidhean Croise  

O zìri ọchichiri, we me ka ọ b͕achie; Ha anupughi kwa isi n'okpuru okwu-Ya nile.


Onye-nwe-ayi Jehova emegheworom ntim, ma Mu onwem enupugh isi, alaghachighm azu.


N'ihi na otú a ka Jehova sirim n'ike nke aka-Ya, O we dọm aka na nti ka m'ghara ije ije n'uzọ ndi nka, si,


M'we zuta ihe-ọkiké dika okwu Jehova si di, m'we tukwasi ya n'úkwù.


Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.


Nwa nke madu, n'etiti ulo nnupu-isi ahu ka i bi, bú ndi nwere anya ihu uzọ, ma ha ahughi, ndi nwere nti inu ihe, ma ha anughi; n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


M'we me otú a, dika enyerem iwu: ihem nile ka m'buputara n'ehihie, dika ihe nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, n'anyasi m'we ji akam gwupuere onwem mb͕idi; n'ọchichiri ka m'bupuru ya, n'ubum ka m'buru ya n'anya-ha.


O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel; i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam.


Nwoke ahu we gwam okwu, si, Nwa nke madu, were anya-gi abua hu, were kwa nti-gi abua nu, tukwasi kwa obi-gi n'ihe nile Mu onwem nēme ka i hu; n'ihi na ọ bu ime ka i hu ha ka emeworo ka i bia ebe a: gosi ulo Israel ihe nile nke gi onwe-gi nāhu.


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.


Agāchikọta Eron na umu-nna-ya n'ala-mọ' n'ihi na ọ gaghi-abà n'ala ahu nke M'nyeworo umu Israel, n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum na miri Meriba.


ọ bughi kwa dika agāsi na unu nēme ndi bu ihe-nketa dika unu bu ndi-nwe-ha, kama nēme onwe-unu ihe-atù ìgwè aturu ntà ahu gēṅomi.


M'we jekuru mọ-ozi ahu, si ya ka o nyem nwa akwukwọ ntà ahu. O we sim, Nara ya, ripia kwa ya; ọ gēme kwa ka afọ-gi lue ilu, ma n'ọnu-gi ọ gātọ utọ dika manu-aṅu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan