Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 2:5 - Bible Nso

5 Ma ha onwe-ha, ma ha gānu, ma ha gāghara, (n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu,) ha gāmara na onye-amuma anọwo n'etiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma ha gere gị ntị, ma ha egeghị gị ntị (ha bụ ndị na-enupu isi), ihe dị mkpa bụ na ha ga-amata na onye amụma anọọla nʼetiti ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 2:5
20 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e Elaisha bú onye nke Chineke, nuru na eze Israel dọwara uwe-ya nile, o we zigara eze ozi, si, N'ìhi gini ka i dọwara uwe-gi nile? biko, ka ọ biakutem, ọ gāmara kwa na onye-amuma di n'Israel.


Eze we ziga Jehudi iweta akwukwọ-npiakọta ahu: o we weputa ya n'ime-ulo Elishama, bú ode-akwukwọ. Jehudi we gua ya na nti abua nke eze, na na nti ndi-isi nile ndi nēguzo n'akuku eze.


Jehova ekwuwo okwu bayere unu, unu ndi Juda fọduru, si, Unu abàla n'Ijipt: maranu nke-ọma na ab͕aworom unu àmà ta.


Nwa nke madu, hà asighi gi, bú ulo Israel, ulo nke nnupu-isi ahu, Gini ka gi onwe-gi nēme?


Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon;


I gāgwa kwa ha okwum nile, ma ha gānu, ma ha gāghara: n'ihi na ndi nānupu isi nke-uku ka ha bu.


Tu-kwa-ra ulo nnupu-isi ahu ilu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Sikwasi ite ahu, sikwasi ya, ọzọ kwa, b͕aye ya miri:


Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n'uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.


M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.


Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme,) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n'etiti ha.


Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.


I gāsi kwa ndi nānupu isi, bú ulo Israel, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: O zuwo unu, site n'ihe-árú nile unu,


Ọ buru na abiaghm, ọ buru kwa na agwaghm ha okwu, ha agaghi-enwewori nmehie: ma ub͕u a ha enweghi ihe-agugọ bayere nmehie-ha.


Pọl na Banabas we kwuwa okwu, si, Ọ di nkpà ka eburu uzọ gwa unu okwu Chineke. Ebe unu nēnupu ya n'aru-unu, nekpe kwa onwe-unu ndi nēkwesighi ndu ebighi-ebi, le, ayi gaje ichighari gwa ndi mba ọzọ okwu.


N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan