Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 19:14 - Bible Nso

14 Ọku we si na nkpa-n'aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n'aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n'aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ọkụ esitela nʼogwe ya rechapụ alaka ya na mkpụrụ ya niile. Ọ dịkwaghị alaka siri ike fọdụrụ nke dịkwa mma ịbụ mkpara eze.’ Abụ a bụ abụ akwa, nke e kwesiri ịbụ mgbe ịkwa akwa.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 19:14
27 Iomraidhean Croise  

Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Ọzọ kwa, o nupuru isi n'okpuru eze, bú Nebukadneza, onye mere ka o were Chineke ṅua iyi: o we kwesie olu-ya ike, b͕a obi-ya ume, ka ọ ghara ichigharikute Jehova, bú Chineke Israel.


Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.


Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa: Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.


N'ihi na ha eripiawo Jekob, Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


Ọ bu kwa ndinyom-i nile na umu-gi ka ha ganēme ka ha pukuru ndi Kaldea: gi onwe-gi agaghi-ewepuga onwe-gi n'aka-ha, kama aka eze Babilon gējide gi: ọ bu kwa obodo a ka i gēsure n'ọku.


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha; Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.


Le, n'ọku ka atubàworo ya ibu nri-ya: isi-ya abua ka ọku ripiaworo, etiti-ya anujiwo kwa; ọ̀ gābà n'ije-ozi ọ bula?


Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.


Ma gi onwe-gi, buliere ndi-isi Israel abù-ákwá,


O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n'etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n'idi-elu-ya n'iba-uba nke alaka-ya nile.


si oké ọhia Negeb, Nuru okwu Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, M'gaje isuye ọku nime gi, ọ gēripia kwa osisi ndu nile ọ bula na osisi nile ọ bula kpọrọ nku nke di nime gi: ire-ọku-ya nēnwu enwu, ọ gaghi-anyu anyu, ọ gāru kwa iru nile site na Negeb rue na Ugwu.


Anu-aru nile, bú madu, gāhu kwa na Mu onwem, bú Jehova, esuyewo ya: ọ gaghi-anyu anyu.


Ha gēbuli kwa abù-ákwá bayere gi, si gi, Le, otú i laworo n'iyì, gi obodo nke madu biri nime gi, bú ndi sitere n'oké osimiri nile, gi obodo nke anēto eto, nke diri ike n'oké osimiri, ya onwe-ya na ndi bi ya, ndi mere ka ndi nile ndi bi nime ya tua ujọ ha!


N'ezie ub͕u a ka ha gāsi, Ọ dighi eze ayi nwere: n'ihi na ayi atughi egwu Jehova; ma eze, gini ka ọ gēmere ayi?


N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:


N'ubọchi ahu ka M'gēguzobe ulo-ntu Devid ọtọ, bú nke dara ada, M'gēmechi kwa ntipú-ya nile; ọ bu kwa ebe-ya nile kwaturu akwatu ka M'gēguzobe ọtọ, wulie ya dika n'ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi gara aga;


Mb͕e Ọ biaruru Jerusalem nso, O we hu obodo ahu we kwara ya ákwá,


Ya mere ndi ahu tiri nkpu, si, Wepu Ya, wepu Ya, kpọgide Ya n'obe. Pailat si ha, M'gākpọgide Eze-unu n'obe? Ndi-isi-nchu-àjà zara, si, Ayi enweghi eze ma-ọbughi Sisa.


Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan