13 Ma ub͕u a akuwo ya n'ọzara, n'ala kpọrọ nku nke miri nādighi.
13 Ugbu a, akụọla ya nʼime ọzara ebe kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị.
O me ndi fọduru site na mma-agha ka ha je biri na Babilon; ha we ghọrọ ya, ghọ-kwa-ra umu-ya, ndi-orù rue ọbubu-eze ala-eze Peasia:
Chineke, ọ bu Chinekem ka I bu; anamachọsi Gi ike: Akpiri Gi akpọwo nkpuru-obim nku, anu-arum achọsiwo Gi ike, N'ala ọkpọ-nku na nke ida-#mbà, ebe miri nādighi.
Chineke nēme ndi nání ha nọ ka ha biri n'ulo: Ọ nēme ka ndi-nkpọrọ puta ba n'ebe ihe nāgara ha nke-ọma: Ma ndi nēwezuga onwe-ha bi n'ala kpọrọ nku.
Nne-gi di ka osisi vine, n'ọbara-gi, n'akuku miri ka akuworo ya: osisi nke nāmi nkpuru nke juputa-kwa-ra na ngalaba ka ọ bu site n'ọtutu miri.
M'gēme kwa ka unu bata n'ọzara nke ndi nile di iche iche, Mu na unu gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu iru na iru.
ka M'we ghara iyipu uwe-ya b͕aba ya ọtọ, guzo ya dika n'ubọchi amuru ya, me ya dika ọzara, do ya ka ala ọkpọ-nku, were akpiri-ikpọ-nku me ka ọ nwua;
Jehova we ropu ha n'ala-ha n'iwe, na'ọnuma, na n'oké iwe, we tubà ha n'ala ọzọ, otú ọ di ta.