Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 19:11 - Bible Nso

11 O we nwe nkpa-n'aka di ike ibu nkpa-n'aka-eze nke ndi nāchi achi, ogologo-ya we di elu rue n'etiti alaka b͕ara ọhia, ewe hu ya n'idi-elu-ya n'iba-uba nke alaka-ya nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Alaka ya niile siri ike, ha topụtara ghọọ mkpara eze. O topụrụ etopụ, tokarịa alaka ndị ọzọ elu. Nke a mere e ji na-ahụ ya anya site nʼebe dị anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 19:11
19 Iomraidhean Croise  

Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


Hairam, bú eze Taia, we zìe ndi-orù-ya jekuru Solomon: n'ihi na ọ nuru na ya ka ha tere manu ibu eze n'ọnọdu nna-ya: n'ihi na onye nāhu Devid n'anya ubọchi nile ka Hairam bu.


Ndi-eze di ike abuwo kwa ndi-isi Jerusalem, bú ndi nwere ike n'aru ndi nile nọ n'ofè osimiri; anēnye kwa ha utu-ala na utu-ahia na utu-uzọ.


Ma otú a ka ha zaghachiri ayi okwu, si, Ayi onwe-ayi bu ndi-orù nke Chineke nke elu-igwe na uwa, ayi nēwu kwa ulo nke ewuru ọtutu arọ gara aga site na mb͕e a, nke otù eze uku nke Israel nwere wuru, wuzu kwa.


Nkpa-n'aka nke ike-gi ka Jehova gēsi na Zaion ziputa: Gi nwe ike n'aru madu n'etiti ndi-iro-gi.


Na ogwe-osisi nke aka-nri-Gi kuworo, Lekwasi kwa ngalaba nke I mere ka o nwere Gi ume.


Ka aka-Gi di n'aru nwoke nke aka-nri-Gi, N'aru nwa nke madu onye I mere ka o nwere Gi ume.


Ome gēsi kwa n'ogwe-osisi Jesi puta, otù alaka nke sitere na nkpọrọgwu-ya gāmi kwa nkpuru:


Ewe ropu ya n'ọnuma, n'ala ka atudara ya, ifufe Iru-anyanwu we me ka nkpuru-ya kpọnwua: ab͕ajipuru nkpa-n'aka-ya nile di ike, ha we kpọnwua; ọku ripiara ha.


Ọku we si na nkpa-n'aka nke alaka-ya nile pua, nkpuru-ya ka o ripiaworo, nkpa-n'aka ọ bula nke di ike we ghara idi nime ya ibu nkpa-n'aka-eze ichi achi. Abù-ákwá ka nka bu, o we ghọ abù-ákwá.


amuru ya amu ka o we b͕ue madu nke-uku; emere ya ka ọ nēb͕u maramara ka o we di ka àmùmà: òbi gatọ kwa ayi utọ? nkpa-n'aka nwam, ọ nāju osisi nile ọ bula.


N'ihi na ọnwunwa di; gini gēme kwa ma ọ buru na ọbuná nkpa-n'aka nke nāju aju ghara idi? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.


Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n'elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile.


Unu gāchiri kwa n'onwe-unu n'ubọchi mbu nkpuru nke osisi ọma, na igu nkwu, na alaka osisi b͕ara ọhia, na osisi willow nke miri-iyi; unu gaṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-unu, ubọchi asa.


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan