Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 18:4 - Bible Nso

4 Le, nkpuru-obi nile, Mu nwe ha; dika nkpuru-obi nna si di, otú a ka nkpuru-obi nwa-ya di kwa, Mu nwe ha; nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na mkpụrụobi niile bụ nke m, ma nke nna ma nke nwa, ha niile bụ nke m. Mkpụrụobi ọbụla mehiere bụ nke ga-anwụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 18:4
19 Iomraidhean Croise  

ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.


Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile.


Ọ buru na umu-gi emehiewo megide Ya, Ọ we zilaga ha n'aka nmehie-ha:


Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:


N'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka M'gānalu ọ̀gù, ọ bughi kwa rue mb͕e nile ka M'ganēwe iwe: n'ihi na mọ gāda #mbà n'irum, ya na nkpuru-obi nile Mu onwem meworo.


Kama onye ọ bula gānwu n'ihi ajọ omume nke aka ya: madu ọ bula nke nēri nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé-ya ganēru izìzì.


Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agaghi-ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya, nna agaghi-ebu kwa ufọdu n'ajọ omume nwa-ya; ezi omume nke onye ezi omume gādi n'isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n'isi ya.


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel.


Ma onye ọ bula, mb͕e ọ bu onye ezi omume, nke nēme ihe ekpere n'ikpe na ezi omume,


Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.


Ibu okwu Jehova eboro Israel. Ihe si n'ọnu Jehova puta, bú Onye nēseti elu-igwe, nātọ kwa ntọ-ala uwa, nākpu kwa mọ madu nime ya:


Ha we da kpue iru-ha n'ala, si, Chineke, bú Chineke nke mọ nile na anu-aru nile, bú madu, nwere, asi na otú nwoke emehie, Ì gēwesa kwa nzukọ a nile iwe?


Ka Jehova, bú Chineke nke mọ anu-aru nile, bú madu, nwere, Ya me otù nwoke ka ọ buru onye-nlekọta nzukọ a,


N'ihi na ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu; ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.


Otú ọ di, ihe edeworo n'akwukwọ nsọ mechibidoro ihe nile n'okpuru nmehie, ka ewe were nkwa ahu nke sitere n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist nye ndi kwere ekwe.


Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya.


Ọzọ kwa, ayi nwere ndi bu nna nke anu-aru-ayi izí ayi ihe site n'inye ayi ahuhu, ayi we sọpuru ha: àyi agaghi-edo kari onwe-ayi nke-uku n'okpuru Nna nke mọ-ayi, we di ndu?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan