Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 18:22 - Bible Nso

22 Njehie-ya nile nke o meworo, agaghi-echeta ha megide ya: n'ezi omume-ya nke o meworo ka ọ gādi ndu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ọ dịghị ajọ omume niile bụ nke ha mere a ga-echeta megide ha. Ha ga-adị ndụ nʼihi ihe ezi omume ha mere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 18:22
22 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua?


Gi onwe-gi si kwa n'elu-igwe nuru, me kwa, kpe ndi-orù-gi ikpe, inyeghachi onye ikpe mara, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.


Dika Iru-anyanwu si di anya n'Ọdida-anyanwu, Otú a ka O meworo ka njehie nile ayi di anya n'ebe ayi nọ.


Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.


Echetala nmehie nile m'mehiere n'okorọbiam, ha na njehiem nile: Dika ebere-Gi si di Gi onwe-gi chetam, N'ihi idi-nma-Gi, Jehova.


Merem amara, Chineke, dika ebere-Gi si di: Dika iba-uba nke obi-ebere-Gi nile si di hichapu njehiem nile.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu Nke nēchichapu njehie-gi nile n'ihi Mu onwem; M'gaghi-echeta kwa nmehie-gi nile.


ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n'ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gāb͕aghara ajọ omume-ha, M'gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.


N'ubọchi ahu, na na mb͕e ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), agāchọ ajọ omume Israel, ma ọ gaghi-adi; agāchọ kwa nmehie nile nke Juda, ma agaghi-achọta kwa ha: n'ihi na M'gāb͕aghara ndi M'nēme ka ha fọdu nmehie-ha.


ma mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, me dika ihe-árú nile si di nke onye nēmebi iwu meworo, ọ̀ gādi kwa ndu? Ezi omume-ya nile nke ọ meworo, agaghi-echeta ha: n'ihe-nmekpu-ya nke o mekpuworo, na nime nmehie-ya nke o mehieworo, nime ha ka ọ gānwu.


Nmehie-ya nile nke o mehieworo agaghi-echeta ha megide ya: ihe ekpere n'ikpe na ezi omume ka o meworo; ọ ghaghi idi ndu.


Ọ gēchighari, nwe obi-ebere n'aru ayi; Ọ gāzọda ajọ omume nile ayi: I gātubà kwa nmehie nile ha n'ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri.


Ya mere ub͕u a ọ dighi amam-ikpe ọ bula diri ndi nọ nime Kraist Jisus.


N'ihi na M'gēmere ajọ omume nile ha ebere, M'gaghi-echeta kwa nmehie nile ha ọzọ ma-ọli.


Umu-ntakirim, unu ekwela ka onye ọ bula duhie unu: onye nēme ezi omume bu onye ezi omume, dika Ya onwe-ya bu onye ezi omume:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan