Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 18:2 - Bible Nso

2 Gini ka unu nēkwu, na unu onwe-unu nātu ilu a bayere ala Israel, si, Nna-ayi-hà eriwo nkpuru-vine nāchaghi acha, ezé umu-ha we nēru izìzì?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Gịnị ka unu bụ mmadụ na-ekwu mgbe unu na-atụ ilu a banyere ala Izrel? “ ‘Ndị bụ nna eriela mkpụrụ vaịnị na-achaghị acha, eze ụmụntakịrị a na-eru ha izizi.’

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 18:2
21 Iomraidhean Croise  

Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


gini mere unu ji azọpia ndim, gwepia kwa iru onye ewedara n'ala? ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


Nna-ayi-hà emehiewo, ha adighi kwa ndu; Ayi onwe-ayi eburuwo ajọ omume nile ha.


Nwa nke madu, Gini bu ilu a unu nwere n'ala Israel, si, Ha di anya, bú ubọchi ahu, ọhù nile ọ bula alawo kwa n'iyì?


Le, onye ọ bula nātu ilu gātu ilu bayere gi, si, Dika nne si di, otú a ka nwa-ya nwanyi di.


Biko, si ulo nnupu-isi ahu, Ùnu amaghi ihe ihe ndia bu? si, Le, eze Babilon biaruru Jerusalem, were eze-ya, na ndi-isi-ya, me ka ha biakute ya rue Babilon;


Okwu Jehova we ruem nti, si,


Ma unu asiwo, Gini mere nwa nējighi ebu ufọdu n'ajọ omume nna-ya? Mb͕e nwa ahu meworo ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, debe ukpurum nile, me ha, ọ ghaghi idi ndu.


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ay Jehova puta), n'ezie ọ gaghi-abu kwa ọlu-unu ọzọ itu ilu a n'Israel.


si umu Amon, Nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na i siri, Ehe, megide ebe nsọm, mb͕e emere ya ka ọ ghara idi nsọ; na imegide ala Israel, mb͕e ọ tọb͕ọrọ n'efu; na imegide ulo Juda, mb͕e ha gara ije biri n'ala ọzọ:


O we sim, Nwa nke madu, ọkpukpu ndia, ulo Israel nile ka ha bu: le, ha nāsi, Ọkpukpu-ayi akpọwo nku, olile-anya-ayi alawo kwa n'iyì; ebipusiwo ayi onwe-ayi.


gwa ha okwu, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem gaje iwere osisi Josef nke di n'aka Efraim, na ebo nile nke Israel ndi ekekọtaworo ya na ha n'otù; M'gētiyekọ kwa ha na ya, bú osisi Juda, me ka ha ghọ otù osisi, ha ewe ghọ otù n'akam.


Ha gēbi kwa n'ala ahu nke M'nyeworo orùm, bú Jekob, nke nna-unu-hà biri nime ya; ha gēbi kwa nime ya, ha onwe-ha, na umu-ha, na umu umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi: Devid, bú orùm, gābu-kwa-ra ha onye-isi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ala Israel, Ọgwugwu: ọgwugwu abiakwasiwo nkuku anọ nke ala-unu.


N'ezie asim unu, ihe ndia nile gābiakwasi ọb͕ọ a.


Ajuju kwesikariri iju, gi madu, bu, Gì onwe-gi bu onye, nke nāza Chineke okwu imegide Ya? Ọ̀ gābu na ihe akpuworo gāsi onye kpuru ya, Gini mere i kpurum otú a?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan