Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 18:14 - Bible Nso

14 Ma, le, asi na ọ muwo nwa, o we hu nmehie nile nke nna-ya, nke o meworo, o we tua egwu, ghara ime ihe dika ihe ndia,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 “Ọ bụrụkwa na nwoke a nwere nwa nwoke nke hụrụ ihe ọjọọ ndị a niile nna ya na-eme, ma kpebie na ọ gakwaghị ebi ụdị ndụ ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 18:14
22 Iomraidhean Croise  

Josaia b͕ara arọ asatọ mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze orú arọ na iri na otù nime Jerusalem: aha nne-ya bu Jedida nwa Adaia nke Bọkzat.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi fọduru n'Israel na nime Juda, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke awusaworo ayi, n'ihi na nna-ayi-hà edebeghi okwu Jehova, ime dika ihe nile si di nke edeworo n'akwukwọ a.


Onye nāmu onye-nzuzu ọ gāburu ya iru-újú: Nna onye-nzuzu adighi-aṅuri kwa ọṅu.


Nna nke onye ezi omume gēteghari egwú ọṅù nke-uku: Onye nāmu kwa onye mara ihe gāṅuri ọṅu na ya.


Ọ dighi kwa onye nēchetara obi-ya, ọ dighi kwa ihe-ọmuma maọbu nghọta di isi, Nkera-ya ka m'sureworo n'ọku; ọzọ kwa, esiwom achicha n'elu icheku-ọku-ya nēre ere; anamaru anu rie: #m'gēme kwa nke fọduru nime ya ka ọ ghọ ihe-árú? ọ̀ bu n'iru ogwe osisi ka m'gāda kpue iru n'ala?


Kama ayi aghaghi ime okwu nile ọ bula nke puworo n'ọnu-ayi, isurere eze-nwanyi nke elu-igwe ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na iwusiri ya àjà-ihe-ọṅuṅu, dika ayi meworo, ayi onwe-ayi, na nna-ayi-ha, na ndi-eze-ayi, na ndi-isi-ayi, n'obodo nile nke Juda, na n'èzí nile nke Jerusalem: ayi we rijue nri afọ, aru adi ayi nma, ọ dighi kwa ihe ọjọ ayi huru.


Aṅaram nti we nu, ihe nēzighi ezi ka ha nēkwu: ọ dighi onye ọ bula chèghariworo uche n'ihe ọjọ ya, si, Gini ka m'meworo? onye ọ bula echighariwo ba n'ọb͕ub͕a-ọsọ-ya, dika inyinya nke nāb͕abiga ọsọ ókè n'agha.


ma ha ejesowo isi-ike nke obi-ha, jeso kwa Bealim, nke ndi bu nna-ha zíri ha:


Asi na ọ muwo nwa nke bu onye nke nēme ihe-ike, onye nāwusi ọbara, nke nēme otù ihe ọ bula n'ihe ndia,


o righi ihe n'elu ugwu, o welighi anya-ya abua le arusi nile nke ulo Israel, o merughi nwunye madu-ibe-ya,


O we hu, si na njehie-ya nile o meworo; ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


M'we si umu-ha n'ọzara, Unu ejegharila n'ukpuru nile nke nna-unu-hà, unu edebe-kwa-la ikpé nile ha, unu eji-kwa-la arusi nile ha meru onwe-unu:


Ma ha adighi-asi n'obi-ha na ọ bu ihe ọjọ nile ha ka M'chetaworo: ub͕u a ka omume nile ha b͕aworo ha buruburu; na ncherita-irum ka ha di.


Ma ub͕u a, otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Tukwasinu obi-unu n'uzọ nile unu.


Biko, tukwasinu obi-unu na mb͕e a, site n'ubọchi ta laghachi azu, site n'ubọchi nke-orú-na-anọ nke ọnwa nke-iteghete, site n'ubọchi ahu mb͕e atọrọ ntọ-ala ulo uku Jehova, tukwasinu obi-unu na ya.


Unu onwe-unu mezu kwa ihe-ọtùtù nke nna-unu-hà.


ebe unu matara na ejighi ihe apuru imebi, bú ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo, b͕aputa unu n'ibi-obi efu unu nke nna-unu-hà nyere unu n'aka ibi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan