Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 17:3 - Bible Nso

3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Sị ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, otu ugo nke nwere nku abụọ buru ibu, nke abụba ya tụrụ agwa agwa ma dịkwa ogologo, feere bịa na Lebanọn, tụjiri ọnụ ọnụ osisi sida kachasị ibe ya ogologo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 17:3
20 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka m'hu, ma, le, nkata fig abua adọbara n'iru ulo uku nke Jehova; mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, mesiri ka Jekonaia nwa Jehoiakim, bú eze Juda, na ndi-isi Juda, na ndi-ọ̀kà, na ndi-uzú, si na Jerusalem je biri n'ala ọzọ, we me ka ha biarue Babilon.


Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.


Idi-egwu-gi, nganga nke obi-gi arafuwo gi, gi onye bi na nb͕awa nile nke nkume ahu di elu, onye nējide ebe di elu nke ugwu ntà: n'ihi na asi na i me akwu-gi ka ọ di elu dika nke ugo, M'gēme ka i si n'ebe ahu ridata; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ndi nāchu ayi di garagara kari ugo nke elu-igwe: N'elu ugwu nile ka ha churu ayi n'ọku ọku, n'ọzara ka ha chere ayi anwu.


ọnu nke alaka-ya nile wara ọhu ka ọ kubipuru, būru ba n'ala izu-ahia; n'obodo ndi-ahia ka o doro ya.


Ugo uku ọzọ di kwa, nke nkù-ya abua di uku, uruma-ya di kwa ọtutu: ma, le, osisi vine a rubere nkpọrọgwu-ya nile n'ebe ọ nọ, ọ bu kwa alaka-ya nile ka ọ wara n'ebe ọ nọ site na nkpuru nile nke ebe akuru ya, ka o we b͕a ya miri.


Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.


ọzọ, n'ebe ọ bula umu nke madu di, anu ọhia na anu-ufe nke elu-igwe ka O nyeworo n'aka-gi, me ka i nwe ike n'aru ha nile: gi onwe-gi bu isi ọla-edo ahu.


gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa.


Nke-mbu di ka ọdum, ọ nwe-kwa-ra nkù abua nke ugo: anọm nēle rue mb͕e ekwopuru nkù-ya abua, ewe si n'ala bulie ya elu, ọ bu kwa n'ukwu abua ka eguzobere ya ọtọ dika madu, ọ bu kwa obi madu ka enyere ya.


Tiye opì-ike n'okpo-ọnu-gi. Dika ugo ka ọ nābia megide ulo Jehova; n'ihi na ha agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, ọ bu kwa iwum ka ha jehieworo megide.


Inyinya-ha nile nwere ukwu nkọ kari agu, ha di kwa nkọ kari anu-ọhia wolf nke anyasi; ndi-inyinya-ha nāwuli kwa elu: e, ndi-inyinya-ha nēsi n'ebe di anya bia; ha nēfe dika ugo nke nēfe ngwa iri ihe.


Ebe ọ bula ozu di, n'ebe ahu ka udele gēzukọ.


Akukọ Ya we jezue na Siria dum: ha we kutara Ya madu nile aru nādighi nma, ndi ọria di iche iche na nmekpa-aru di iche iche nējisi ike, ndi mọ ọjọ ji, ha na ndi ọnwa nēme ka anya ghara idi ha nma, na ndi akuku-aru-ha nwuru anwu; O we me ka aru di ha ike.


Jehova gēsi n'ebe di anya bulie otù mba imegide gi, site na nsọtu uwa, dika ugo si efe; bú mba nke i nānughi asusu-ya;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan