Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 17:19 - Bible Nso

19 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M'gātukwasi kwa ya n'isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 “ ‘Ya mere, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, Dịka mụ onwe m na-adị ndụ, aga m akwụghachi ya nʼihi nleda anya o ledara ịṅụ iyi m nakwa nʼihi ọgbụgba ndụ nke o mebiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 17:19
14 Iomraidhean Croise  

Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


Ọbara-ha gālaghachi kwa n'isi Joab, na n'isi nkpuru-ya rue mb͕e ebighi-ebi: ma udo gādiri Devid, di-kwa-ra nkpuru-ya, di-kwa-ra ulo-ya, di-kwa-ra oche-eze-ya, rue mb͕e ebighi-ebi, site na Jehova.


O gēru kwa, na mba ahu na ala-eze ahu nke nāgaghi-efè onye ahu, bú Nebukadneza eze Babilon, nke nāgaghi-etiye kwa olu-ya na yoke nke eze Babilon, M'gēji mma-agha, ji kwa oké unwu, ji kwa ajọ ọria nēfe efe, leta mba ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), rue mb͕e M'mere ka ha gwusia site n'aka-ya.


eze, bú Zedekaia, we ziga, kuta ya: eze we jua ya n'ulo-ya na nzuzo, si, Ọ̀ di okwu ọ bula sitere na Jehova? Jeremaia we si, Okwu di. O we si, N'aka eze Babilon ka agēnye gi.


Ma ọ buru na ha asi, Jehova nādi ndu; n'ezie n'okwu-ugha ka ha na-aṅu iyi.


M'gaghi-eleta n'ihi ihe ndia? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: nkpuru-obim, ọ̀ gaghi-abọ̀ kwa mba nke di otú a ọ́bọ̀?


N'ihi na i chetaghi ubọchi nile nke mb͕e i di na nwata, i we mekpam aru n'ihe ndia nile; n'ihi ya, le, Mu onwem gētiyekwasi kwa uzọ-gi n'isi-gi, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): ì meghi kwa ajọ ihe-nzube a tukwasi n'ihe-árú-gi nile?


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n'imebi ọb͕ub͕a-ndu.


Ebe o ledara ọb͕ub͕a-iyi n'imebi ọb͕ub͕a-ndu, ma, le, o nyereri aka-ya n'ikweye, ma ọ bu ihe ndia nile ka o mere; ọ gaghi-ewepuga onwe-ya.


M'gāb͕asa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm, M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, Mu na ya gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere nmekpu-ya nke o mekpuru megidem.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan