Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 17:18 - Bible Nso

18 Ebe o ledara ọb͕ub͕a-iyi n'imebi ọb͕ub͕a-ndu, ma, le, o nyereri aka-ya n'ikweye, ma ọ bu ihe ndia nile ka o mere; ọ gaghi-ewepuga onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 O lelịrị ịṅụ iyi ahụ site nʼimebi ọgbụgba ndụ ahụ. Nʼihi na o nyere aka ya nʼihe ibe ma gaa nʼihu mee ihe ndị a niile, mgbapụ agaghị adịrị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 17:18
9 Iomraidhean Croise  

O si n'ebe ahu je, we huta Jehonadab nwa Rikab, ka ọ nābia izute ya: ọ gọzie ya, si ya, Obi-gi, ò ziri ezi, dika obim di n'ebe obi-gi di? Jehonadab we si, Otú a ka ọ di. Ọ buru na ọ di otú a, nyem aka-gi. O we nye ya aka-ya; o we me ka ọ rigo n'ub͕ọ-ala-ya.


Ndi-isi nile, na ndi-dike, na umu-ndikom nile kwa nke eze, bú Devid, kweye-kwa-ra inọ n'okpuru Solomon, bú eze.


Ub͕u a unu ekwesila olu-unu ike, dika nna-unu-hà mere; ma nyenu Jehova aka-unu, ba n'ebe nsọ Ya, nke O doworo nsọ rue mb͕e ebighi-ebi, fè-kwa-nu Jehova, bú Chineke-unu, òfùfè, ka iwe-Ya nke di ọku we si n'ebe unu nọ chigharia.


Mu onwem nādu gi ọdu, Debe okwu-ọnu eze, ọbuná n'ihi ọṅuṅu-iyi Chineke.


Ijipt ka ayi kweyeworo ekweye, Ya na Asiria, ka nri we ju ayi afọ.


O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n'ebe ọ nọ n'etiti Babilon ka ọ gānwu.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem nādi ndu, n'ezie ọb͕ub͕a-iyim nke o ledaworo, na ọb͕ub͕a-ndum nke o mebiworo, M'gātukwasi kwa ya n'isi-ya.


Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n'anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan