Izikiel 17:16 - Bible Nso16 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n'ebe ọ nọ n'etiti Babilon ka ọ gānwu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a16 “ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya. Faic an caibideil |
M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.