Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 17:16 - Bible Nso

16 Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), n'ezie n'ebe eze ahu bi nke meworo ya eze, bú onye o ledara ọb͕ub͕a-iyi-ya, onye o mebi-kwa-ra ọb͕ub͕a-ndu-ya, n'ebe ọ nọ n'etiti Babilon ka ọ gānwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 “ ‘Nʼezie, dịka mụ onwe m na-adị ndụ, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri, ọ ga-anwụ na Babilọn, nʼala nke eze ahụ mere ka ọ nọkwasị nʼocheeze, bụ onye o ledara ịṅụ iyi ya anya mebikwaa ọgbụgba ndụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 17:16
25 Iomraidhean Croise  

Eze we kpọ ndi Gibeon, si ha; (ma ndi Gibeon, ọ bughi n'umu Israel ka ha sitere, kama ha sitere na ndi-Amorait fọduru; ma umu Israel ṅuru ha iyi: ma Sọl chọrọ itib͕u ha n'ekworo n'ihi umu Israel na Juda:)


Eze Babilon we me Matanaia nwa-nne nna-ya eze n'ọnọdu ya, gughari kwa ya aha Zedekaia.


N'ihi na ọ bu n'ihi iwe Jehova ka ọ di otú a nime Jerusalem na nime Juda, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha: Zedekaia we nupu isi n'okpuru eze Babilon.


Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya.


Gi eburula aha Jehova, bú Chineke-gi, ime ihe efu; n'ihi na Jehova agaghi-agu onye nēburu aha-Ya ime ihe efu n'onye ikpé nāmaghi.


Ma o buru na gi onwe-gi aju izipu ha, le, Mu onwem gaje iwere awọ tie ókè-ala-gi nile:


Ọ bu kwa Zedekaia, bú eze Juda, na ndi-isi-ya ka M'gēnye n'aka ndi-iro-ha, na n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka usu-ndi-agha nke eze Babilon, ndi nēsi n'ebe unu nọ rigo la.


O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua, o were kwa ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, ime ka ọ ba Babilon.


O me-kwa-ra ka Zedekaia kpue ìsì n'anya-ya abua; eze Babilon we were ihe-ọla eji ke ukwu ke ya ab͕u, me ka ọ ba na Babilon, tiye ya n'ulo-ndebe rue ubọchi ọnwu-ya.


M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n'imebi ọb͕ub͕a-ndu.


Ma, le, ebe akuworo ya, ìhe gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gaghi-akpọnwusi, mb͕e ifufe Iru-anyanwu nēfetu ya? nime nkpuru ebe o puru epu ka ọ gākpọnwu.


o we were otù onye sitere na nkpuru ala-eze ahu, ya na ya we b͕a ndu; o we me ka ọ ba n'ọb͕ub͕a-iyi, ọ bu kwa ndi nile di ike nke ala-ya ka ọ chiri:


Ọ gādi-kwa-ra ha ka ọjuju-ase efu n'anya-ha, bú ndi ṅuworo ha iyi di iche iche: ma ya onwe-ya nēme ka echeta ajọ omume, ka ewe jide ha.


Ha ekwuwo okwu efu di iche iche, ha nāb͕a iyi ugha, ha nāb͕a ndu: ikpe ewe pulite dika hemlok nime ọ̀b͕à ubi.


M'gābiakute unu nso ikpe ikpé; M'gābu kwa onye-àmà di ngwa megide ndi-mḅasi, na imegide ndi nākwa iko, na imegide ndi nāṅu iyi ugha, na imegide ndi nēmeḅu onye egoro ọlu n'ugwọ lu-ya na nwan yi di-ya nwuru na nwa-nḅei, ndi nēwezuga kwa ọbìa n'ihe-ya, ndi nādighi-atu agwu m, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Nwoke ọ bula, mb͕e ọ gēkwe Jehova nkwa, ma-ọbu mb͕e ọ gāṅu iyi iwere isọ-nsọ ke nkpuru-obi-ya ab͕u, ọ gaghi-eme ka okwu-ya ghara idi nsọ; dika ihe nile si di nke nēsi n'ọnu-ya puta, otú a ka ọ gēme.


Ndi nēnweghi nghọta, ndi nēmebi ọb͕ub͕a-ndu, ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nēnweghi obi-ebere:


nye ndi nākwa iko, nye ndikom nēmeru onwe-ha n'aru ndikom, nye ndi nēzu madu n'ori, nye ndi-ugha, nye ndi nāṅu iyi ugha, ma ọ buru kwa na ihe ọ bula ọzọ di iche di nēmegide ozizí ahu nke nēnye ezi ndu;


ndi ihe madu-ibe-ha nādighi-atọ utọ, ndi nādighi-ab͕a ndu, ndi nēbo ebubo ugha, ndi nādighi-ejide onwe-ha, ndi di ka anu-ọhia, ndi nādighi-ahu ezi ihe n'anya,


Nka ka ayi gēme ha, kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n'ihi iyi ahu nke ayi ṅuru ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan