Izikiel 16:7 - Bible Nso7 Ihe bara uba dika ihe-opupú nke ọhia ka M'meworo gi, i we ba uba, bùe ibù, biarue n'ihe-ichọ-nma kachasi ihe-ichọ-nma nile; i kpuru ara, agiri-isi-gi puchi-kwa-ra epuchi; ma gi onwe-gi b͕asiri ọtọ. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Emere m ka ị too dịka osisi na-eto eto nʼime ọhịa. I tolitere, too ogologo ma tozuo oke na nwanyị, ị kpụrụ ara, agịrị isi gị pukwara, ma gị onwe gị gba ọtọ. Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.