Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 16:53 - Bible Nso

53 M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

53 “ ‘Ma otu ọ dị, aga m eme ka ọganihu nke Sọdọm na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke Sameria na ụmụ ya ndị inyom, na ọganihu nke gị dịghachikwa nʼetiti ha:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 16:53
21 Iomraidhean Croise  

Jehova me-kwa-ra ka ndọta-n'agha Job lata, mb͕e o kpere ekpere bayere ndi-eyì-ya: Jehova we tukwasi n'ihe nile Job nwere okpùkpù abua.


Mb͕e Jehova mere ka ndi nālata na Zaion lata, Ayi di ka ndi nārọ nrọ.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nzọputa Israel esi na Zaion puta! Mb͕e Jehova gēji me ka ndọta-n'agha ndi-Ya lata, Ka Jekob tegharia egwú ọṅù, ka Israel ṅuria ọṅu.


Jehova, ihe ala-Gi atọwo Gi utọ: I mewo ndi Jekob adọtara n'agha ka ha lata.


Ọ buru na Jehova nke usu nile nke ndi-agha emeghi madu ole-na-ole nke fọduru ka ha fọduru ayi, ayi gādiwori ka Sọdọm, ayi gēyiwori Gọmọra.


Ọ gēru kwa, ọ buru na ha amuta uzọ nile nke ndim nke-ọma, iji aham ṅu iyi, si, Jehova nādi ndu; dika ha zíri ndim iji Beal ṅu iyi; agēwuli kwa ha dika ulo n'etiti ndim.


Ka nwoke ahu di kwa ka obodo nile nke Jehova kwaturu, ghara ichèghari: ya nu kwa iti-nkpu n'ututu, na iti-nkpu agha n'etiti-ehihie;


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Ha gēkwu kwa okwu a ọzọ n'ala Juda, na n'obodo-ya nile, mb͕e m'gēme ka ndi-ya adọtara n.agha lata, si: Jehova gọzie gi, gi ebe-obibi nke ezi omume, gi ugwu nke idi-nsọ.


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru mgbū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


Ma M'gēme ka ndi Moab adọtara n'agha laghachi n'ikpe-azu nke ubọchi nile; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Rue ebe a bu ikpé Moab.


Ma o gēru, n'ikpe-azu nke ubọchi nile, na M'gēme ka ndi Ilam adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ma emesia M'gēme ka umu Amon adọtara n'agha laghachi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.


Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi.


Ma umu-ya ndinyom ndi nọ n'ọhia, agēji mma-agha b͕ue ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.


N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan