Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 16:52 - Bible Nso

52 Gi onwe-gi kwa, būru ihere-gi, ebe i kpeworo uche-gi bayere umu-nne-gi ndinyom; site na nmehie-gi nile nke i meworo ihe-árú na ha kari ha, ha bu ndi ezi omume kari gi: e, gi onwe-gi kwa, ka ihere me gi, būru kwa ọnọdu-ihere-gi, n'ihi na i guworo umu-nne-gi ndinyom na ndi ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

52 Gị onwe gị buru ihe ihere gị, nʼihi na omume gị ekpepụtala ụmụnne gị ndị inyom. Nʼihi na mmehie gị dị njọ, dịkwa ukwuu karịa nke ha, ha bụ ndị a gụrụ na ndị ezi omume karịa gị. Ya mere, ka ihere mee gị, burukwa ọnọdụ ihere gị, nʼihi na ị meela ka a gụọ ụmụnne gị ndị inyom dịka ndị ezi omume.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 16:52
27 Iomraidhean Croise  

Juda we mata ha, ọ si, Ọ bu onye ezi omume kari mu onwem; n'ihi na eweghm ya nye Shila, bú nwam. Ma ọ maghi kwa ya ọzọ ma-ọli.


Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


M'gētiyekwasi kwa unu ita-uta di mb͕e ebighi-ebi, ya na itiye n'ọnọdu-ihere di mb͕e ebighi-ebi, nke agaghi-echezọ echezọ.


Jehova we sim, Israel nke nādaghachi azu egosiwo onwe-ya onye ezi omume kari Juda nke nāghọb͕u aghọb͕u.


N'ezie mb͕e m'chigharisiri, m'we chegharia: ọzọ, mb͕e emesiri ka m'mara, m'we tie aka n'apata-ukwum; ihere merem, ewe tiyekwam n'ọnọdu-ihere, n'ihi na eburum ita-uta nke mb͕e m'di na nwata.


Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.


Ma ọ bughi n'uzọ di iche iche ha ka i jeworo ije, ọ bughi kwa dika ihe-árú nile ha si di ka i meworo; kama, dika agāsi na nke ahu bu nọ̄ ihe ntà, i we bibie onwe-gi kari ha n'uzọ-gi nile.


Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, emeghi, ya onwe-ya ma-ọbu umu-ya ndinyom, otú i meworo, gi onwe-gi na umu-gi ndinyom.


M'gēme kwa ka ndọta-n'agha-ha chigharia, bú ndọta-n'agha nke Sọdọm na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke Sameria na umu-ya ndinyom, na ndọta-n'agha nke ndi-gi adọtara n'agha n'etiti ha:


Ka i we būru ọnọdu-ihere-gi, ka ihere we me kwa gi n'ihi ihe nile nke i meworo, n'ikasi ha obi.


Ma Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi, abughi aha anuru n'ọnu-gi n'ubọchi npako-gi;


ka i we cheta, ihere ewe me gi, i we ghara isaghe kwa ọnu-gi ọzọ ma-ọli, n'ihi ihere-gi; mb͕e M'gēkpuchiworo gi-ri ihe nile i meworo; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ebe ahu ka Ilam na ìgwè ndi-ya nile ndi nọ ílì-ya buruburu di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha, ndi ridara n'ebighi-úgwù rue ala di n'okpuru uwa, bú ndi mere ka ujọ-ha di n'ala ndi di ndu, we būru ihere-ha, ha na ndi nārida n'olùlù.


M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ha gēbu kwa ihere-ha, na nmekpu nile ha nke ha mekpuworo megidem, mb͕e ha gēbi n'ala-ha na ntukwasi-obi, mb͕e ọ gaghi-adi onye ọ bula nēme ka ha ma jijiji;


Ma ha agaghi-abiakutem nso, iburum ndi-nchu-àjà, na ibiaru ihe nsọm nile nso, bú ihe nile di nsọ kachasi ihe nsọ nile: ma ha gēbu ọnọdu-ihere-ha, na ihe-árú nile ha nke ha meworo.


Ọ bu kwa ihe ahu ka agēduga n'Asiria, ibu onyinye-inata-iru-ọma agēnye eze, bú Jereb: ihere ka Efraim gānata, ihere ndum-ọdu-ya gēme kwa Israel.


Ọzọ, unu ekpela ikpé, agaghi-ekpe kwa unu ikpé ma-ọli: unu amakwala ikpé, agaghi-ama kwa unu ikpé ma-ọli: rapunu, agārapu kwa unu:


madu ndi, ọ bu ezie na ha mazuru ihe Chineke guru n'ihe ziri ezi, na ndi nēme ihe di otú a kwesiri ọnwu, ma ọ bughi nání na ha nēme ha, kama ndi nēme ha di kwa ha ezi nma.


ma otuto na nsọpuru na udo gādiri onye ọ bula nke nālu ezi ọlu, onye-Ju na mbu, na onye-Grik kwa:


Ọ̀ bu nkpuru gini kwa ka unu nwere n'oge ahu n'ihe nile ahu nke ihere ha nēme unu ub͕u a? n'ihi na ọgwugwu ihe nile ahu bu ọnwu.


Ọ si Devid, Onye ezi omume ka i bu karim: n'ihi na gi onwe-gi emewom ezi ihe, ma mu onwem emewo gi ihe ọjọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan