Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Izikiel 16:41 - Bible Nso

41 Ha gēsure kwa ulo-gi nile n'ọku, meso gi ihe nile ekpere n'ikpe n'anya ọtutu ndinyom; M'gēme kwa ka i kwusi ikwa iko; ọzọ, i gaghi-enye kwa onyinye ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

41 Ha ga-agba ụlọ gị ọkụ ma takwaa gị ahụhụ nʼihu ọtụtụ ndị inyom. Aga m ahụkwa na ị kwụsịrị ịkwa iko ị na-akwa, ị ga-akwụsịkwa ịkwụ ụgwọ ahụ ị na-akwụ ndị iko gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Izikiel 16:41
24 Iomraidhean Croise  

o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


Dika ndi nēmebi iwu ka O tiworo ha aka N'ọnọdu ndi nāhu ha anya;


Ma ihe-efu-ha, ha nile aghaghi igasi.


N'ihi nka agēwere nka kpuchie ajọ omume Jekob, nka bu kwa nkpuru nile nke iwezuga nmehie-ya: mb͕e O ji eme nkume nile nke ebe-ichu-àjà ka ha di ka nkume nzu etipiara etipia, Asherim na arusi-anyanwu nile agaghi-ebili ọzọ.


Ọ bu kwa ulo eze na ulo nile nke ndi Israel ka ndi Kaldea surere n'ọku, ha kwatu-kwa-ra mb͕idi nile nke Jerusalem.


o sure ulo Jehova ọku, na ulo eze; ọ bu kwa ulo nile nke Jerusalem, bú ulo uku ọ bula, ka o surere n'ọku.


M'gēme kwa ka unu si n'etiti ya puta, M'gēnye kwa unu n'aka ndi ala ọzọ, me ihe nile ekpere n'ikpe n'etiti unu.


Ndinyom nile nke nākwa iko ka ha nēnye onyinye: ma gi onwe-gi enyewo ndikom nile nāhu gi n'anya onyinye-gi nile, i we go ha ngo, ka ha si n'ebe nile di buruburu biakute gi n'ihi ikwa-iko-gi nile.


Ndi ahu kpughere ọtọ-ya: umu-ya ndikom na umu-ya ndinyom ka ha chiri, ma ya onwe-ya ka ha jiri mma-agha b͕ue: o we ghọrọ ndinyom aha iji dọ ha aka na nti; ọ bu kwa ihe nile ekpere n'ikpe ka ha mere n'aru ya.


M'gēme kwa ka ajọ ihe-nzube-gi kwusi n'aru gi, ya na ikwa-iko-gi nile sitere n'ala Ijipt: i gaghi-eweli kwa anya-gi abua le ha, i gaghi-echeta kwa Ijipt ọzọ.


M'gēme kwa ka ajọ nzube kwusi n'ala-unu, ka ewe dọ ndinyom nile aka na nti, ha ewe ghara ime dika ajọ nzube-unu si di.


ha agaghi-eji kwa arusi nile ha, ma-ọbu ihe-árú nile ha, ma-ọbu njehie nile ha, meru onwe-ha ọzọ: kama M'gāzọputa ha n'ebe-obibi nile ha, ebe ha mehieworo, M'gēme kwa ka ha di ọcha: ha ewe ghọrọm otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke.


Ọ gābu-kwa-ra mba nile nke di gi buruburu ihe-ita-uta, na ihe-nkwulu, na ihe-idọ-aka-na-nti, na ihe-iju-anya, mb͕e M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe nime gi n'iwe, na n'ọnuma, na n'iba-nba nile nke ọnuma: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo:


n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu nēmegide gi, ọbuná Mu onwem; M'gēme kwa ihe nile nke ekpere n'ikpe n'etiti gi n'anya mba nile.


N'ihi nka ka agēji plough gwu Zaion dika ubi n'ihi unu, Jerusalem gāghọ kwa obo-ihe obo-ihe, ugwu nke ulo ahu gādi kwa ka ebe di elu nke oké ọhia.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gēbipu aha nile nke arusi nile n'ala nka, agaghi-echeta kwa ha ọzọ: ọzọ kwa, M'gēme ka ndi-amuma na mọ nke iru-árú si n'ala nka gabiga.


Israel nile gānu kwa, we tua egwu, ha agaghi-eme kwa ọzọ dika ihe ọjọ a si di n'etiti gi.


I gākwakọba kwa ihe-nkwata-ya nile n'etiti amá-ya, sure-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, obodo ahu na ihe-nkwata-ya nile dum n'ọku: ọ gābu kwa obo mb͕e ebighi-ebi; agaghi-ewu ya ọzọ.


ha gēme kwa ka nwa-ab͕ọghọ ahu putarue ọnu-uzọ ulo nna-ya, ndikom obodo-ya gēwere nkume tub͕ue ya ka ọ we nwua: n'ihi na o mere ihe-nzuzu n'Israel, ikwa iko n'ulo nna-ya: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


unu gēme kwa ka ha abua putarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, unu gēwere nkume tub͕ue ha, ka ha we nwua; nwa-ab͕ọghọ ahu, n'ihi na o tighi nkpu n'obodo: na nwoke ahu, n'ihi na o wedawo nwunye madu-ibe-ya n'ala: i we kpochapu ihe ọjọ ahu n'etiti gi.


Nātu ndi nēmehie nmehie-ha n'anya n'iru madu nile, ka ndi fọduru we tu kwa egwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan